Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ezikiel 13:3-11 Bible Nso (IGBOB)

3. Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: Ahuhu diri ndi-amuma nzuzu, ndi nējeso mọ nke ha, na ihe nke ha nāhughi!

4. Dika nkita-ọhia nime nkpọnkpọ ebe ka ndi-amuma-gi diworo, gi Israel.

5. Unu arigoghi na ntipú, unu ab͕aghi kwa ogige nye ulo Israel, iguzo n'agha n'ubọchi Jehova.

6. Ha ahuwo ọhù efu na iju-ase ugha, bú ndi nāsi, Ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta; ma Jehova eziteghi ha: ha we le anya na ha gēme ka okwu guzosie ike.

7. Ọ̀ bughi ọhù efu ka unu huworo, ọ̀ bughi kwa okwu iju-ase ugha ka unu kwuworo, mb͕e unu nāsi, Ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta; ma Mu onwem ekwughi okwu?

8. N'ihi nka ka Onye-nwe-ayi Jehova ji si otú a: N'ihi na unu ekwuwo okwu efu, hu ọhù ugha, n'ihi nka, le, Mu nēmegide unu; ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta.

9. Akam gādi kwa imegide ndi-amuma ahu ndi nāhu ọhù efu, ndi nāju kwa ase ugha: ha agaghi-adi n'ìzù nzuzo nke ndim, agaghi-ede kwa ha n'odide-akwukwọ ulo Israel, ha agaghi-abà kwa n'ala Israel; unu ewe mara na Mu onwem bu Onye-nwe-unu Jehova.

10. N'ihi na, ọ bu n'ihi na ha ewezugawo ndim, si, Udo; ma udo adighi; ndim ahu nālu kwa mb͕idi nādighi ike, ma, le, ha nēte ya nzu:

11. gi si ndi nēte ya nzu, na ọ gāda: oké miri-ozuzo nke nēzobiga ókè gēzo; unu onwe-unu kwa, oké ákú-miri-ígwé, gāda; oké ifufe gāb͕awa kwa ya.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ezikiel 13