Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ezikiel 12:22-28 Bible Nso (IGBOB)

22. Nwa nke madu, Gini bu ilu a unu nwere n'ala Israel, si, Ha di anya, bú ubọchi ahu, ọhù nile ọ bula alawo kwa n'iyì?

23. N'ihi nka si ha, Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: M'gēme ka ilu a kwusi, ha agaghi-atu kwa ya dika ilu n'Israel ọzọ; kama gwa ha okwu, si, Ha di nso, bú ubọchi ahu, ha na okwu ọhù ọ bula.

24. N'ihi na ọhù efu ọ bula, ma-ọbu iju-ase ire-utọ, agaghi-adi kwa n'etiti ulo Israel.

25. N'ihi na Mu onwem bu Jehova; M'gēkwu okwu, okwu nke M'gēkwu, agēme kwa ya; agaghi-eme kwa ya ka ọ di anya ọzọ: n'ihi na n'ubọchi-unu, unu ulo nke nnupu-isi, ka M'gēkwu okwu, me ya; ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta.

26. Okwu Jehova we ruem nti, si,

27. Nwa nke madu, le, ulo Israel nāsi, Ọhù ahu nke ya onwe-ya nāhu diri ọtutu ubọchi di n'iru, ọ bu kwa mb͕e di anya ka ya onwe-ya nēburu amuma.

28. N'ihi nka si ha, Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: Ọ dighi okwu ọ bula n'okwum nile agēme kwa ka ọ di anya ọzọ, ma okwu nke M'gēkwu, agēme kwa ya; ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ezikiel 12