Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ezikiel 12:18-27 Bible Nso (IGBOB)

18. Nwa nke madu, nri-gi ka i gēwere ime-nkpatu rie, miri-gi ka i gēwere kwa ọma-jijiji na ncheb͕u ṅua;

19. i gāsi kwa ndi ala nka, Okwu di otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova kwuru bayere ndi bi na Jerusalem, baye-kwa-ra ala Israel, si: Nri-ha ka ha gēwere ncheb͕u rie, miri-ha ka ha gēwere kwa iju-anya ṅua, ka ala-ya we tọb͕ọrọ n'efu ghara inwe ùjú-ya, site n'ihe-ike nke ndi nile bi nime ya.

20. Agēme kwa ka obodo-ya nile ebi ebi ghọ nkpọnkpọ ebe, ala gābu kwa ebe tọb͕ọrọ n'efu, unu ewe mara na Mu onwem bu Jehova.

21. Okwu Jehova we ruem nti, si,

22. Nwa nke madu, Gini bu ilu a unu nwere n'ala Israel, si, Ha di anya, bú ubọchi ahu, ọhù nile ọ bula alawo kwa n'iyì?

23. N'ihi nka si ha, Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: M'gēme ka ilu a kwusi, ha agaghi-atu kwa ya dika ilu n'Israel ọzọ; kama gwa ha okwu, si, Ha di nso, bú ubọchi ahu, ha na okwu ọhù ọ bula.

24. N'ihi na ọhù efu ọ bula, ma-ọbu iju-ase ire-utọ, agaghi-adi kwa n'etiti ulo Israel.

25. N'ihi na Mu onwem bu Jehova; M'gēkwu okwu, okwu nke M'gēkwu, agēme kwa ya; agaghi-eme kwa ya ka ọ di anya ọzọ: n'ihi na n'ubọchi-unu, unu ulo nke nnupu-isi, ka M'gēkwu okwu, me ya; ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta.

26. Okwu Jehova we ruem nti, si,

27. Nwa nke madu, le, ulo Israel nāsi, Ọhù ahu nke ya onwe-ya nāhu diri ọtutu ubọchi di n'iru, ọ bu kwa mb͕e di anya ka ya onwe-ya nēburu amuma.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ezikiel 12