Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ezikiel 12:15-22 Bible Nso (IGBOB)

15. Ha gāmara kwa na Mu onwem bu Jehova, mb͕e M'gāchusa ha n'etiti mba nile, fesa kwa ha n'ala nile.

16. Ma M'gēme ka ndikom ole-na-ole nime ha fọdu pua na mma-agha, na n'oké unwu, na n'ajọ ọria nēfe efe; ka ha we kọ akukọ ihe-árú nile ha n'etiti mba nile ebe ha gābiawori; ha ewe mara na Mu onwem bu Jehova.

17. Okwu Jehova we ruem nti, si,

18. Nwa nke madu, nri-gi ka i gēwere ime-nkpatu rie, miri-gi ka i gēwere kwa ọma-jijiji na ncheb͕u ṅua;

19. i gāsi kwa ndi ala nka, Okwu di otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova kwuru bayere ndi bi na Jerusalem, baye-kwa-ra ala Israel, si: Nri-ha ka ha gēwere ncheb͕u rie, miri-ha ka ha gēwere kwa iju-anya ṅua, ka ala-ya we tọb͕ọrọ n'efu ghara inwe ùjú-ya, site n'ihe-ike nke ndi nile bi nime ya.

20. Agēme kwa ka obodo-ya nile ebi ebi ghọ nkpọnkpọ ebe, ala gābu kwa ebe tọb͕ọrọ n'efu, unu ewe mara na Mu onwem bu Jehova.

21. Okwu Jehova we ruem nti, si,

22. Nwa nke madu, Gini bu ilu a unu nwere n'ala Israel, si, Ha di anya, bú ubọchi ahu, ọhù nile ọ bula alawo kwa n'iyì?

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ezikiel 12