Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ezikiel 11:9-13 Bible Nso (IGBOB)

9. M'gēme kwa ka unu si n'etiti ya puta, M'gēnye kwa unu n'aka ndi ala ọzọ, me ihe nile ekpere n'ikpe n'etiti unu.

10. Site na mma-agha ka unu gāda; n'ókè-ala Israel ka M'gēkpe unu ikpe; unu ewe mara na Mu onwem bu Jehova.

11. Obodo nka agaghi-aghọrọ unu ite, unu onwe-unu agaghi-aghọ kwa anu n'etiti ya; n'ókè-ala Israel ka M'gekpe unu ikpe;

12. unu ewe mara na Mu onwem bu Jehova: n'ihi na n'ukpurum nile ka unu nējegharighi, ọ bu kwa ihe nile nke M'kpere n'ikpe ka unu nēmeghi, kama ọ bu dika ikpé nile nke mba nile nke di unu buruburu si di ka unu meworo.

13. O rue, mb͕e M'buru amuma, na Pelataia nwa Benaia nwuru. M'we da kpue irum n'ala, tie nkpu n'oké olu, si, Ewó, Onye-nwe-ayi Jehova! ọ̀ bu ka ndi Israel fọduru gwusia ka Gi onwe-gi nēme?

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ezikiel 11