Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ezikiel 11:18-25 Bible Nso (IGBOB)

18. Ha gābà kwa n'ebe ahu, ha gēsi kwa na ya wezuga ihe-ya nile jọb͕uru onwe-ha, na ihe-árú-ya nile.

19. M'gēnye kwa ha otù obi, ọ bu kwa mọ ọhu ka M'gētiye nime unu; M'gēwezuga kwa obi nkume n'anu-aru-ha, nye ha obi anu-aru:

20. ka ha we jegharia n'ukpurum nile, debe kwa ikpém nile, me ha: ha gābu-kwa-ram otù ndi, Mu onwem gābu-kwa-ra ha Chineke.

21. Ma ndi obi-ha nējeso obi nke ihe nile ha nke jọb͕uru onwe-ha na ihe-árú nile ha, uzọ-ha ka M'gātukwasi n'isi ha; ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta.

22. Cherubim ahu we chilie nkù-ha, wheel nile ha di kwa n'akuku ha; ebube nke Chineke nke Israel di kwa n'elu ha n'elu.

23. Ebube Jehova we si n'etiti obodo ahu rigo, guzo n'elu ugwu ahu nke di n'akuku Iru-anyanwu nke obodo ahu.

24. Ma Mọ Chineke bulirim, me ka m'bata na Kaldea biakute ndi emere ka ha je biri n'ala ọzọ, n'ọhuhu-ihe ahu nime Mọ Chineke. Ọhuhu-ihe ahu nke m'hururi we si n'ebe m'nọ rigo.

25. M'we gwa ndi ahu emere ka ha je biri n'ala ọzọ ihe nile nke Jehova mere ka m'hu.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ezikiel 11