Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ezikiel 10:2-16 Bible Nso (IGBOB)

2. O we gwa nwoke ahu nke yiri uwe ọcha okwu, si, Ba n'etiti ihe ahu nākpọre, n'okpuru cherub, kpojue icheku ọku nēre ere n'aka-gi abua site n'etiti cherubim, fesa ha n'elu obodo a. O we ba n'etiti ha n'anyam.

3. Ma cherubim ahu nēguzo n'aka-nri nke ulo ahu, mb͕e nwoke ahu bàra; igwe-oji ahu juputa-kwa-ra ogige di nime.

4. Ebube Jehova we si n'elu cherub rigo, guzo n'elu nbata-uzọ nke ulo ahu; ulo ahu we juputa n'igwe-oji ahu; ogige-ya juputa-kwa-ra n'onwunwu-ìhè nke ebube Jehova.

5. Anu-kwa-ra olu nkù nile nke cherubim rue ogige di n'èzí, dika olu nke Chineke Nke puru ime ihe nile mb͕e Ọ nēkwu okwu.

6. O rue, mb͕e O nyere nwoke ahu nke yiri uwe ọcha iwu, si, Si n'etiti ihe nke nākpọre, si n'etiti cherubim, guputa ọku, na ọ bàra, guzo n'akuku wheel.

7. Cherub ahu we si n'etiti cherubim setipu aka-ya rue ọku ahu nke di n'etiti cherubim, were ufọdu tiye n'aka abua nke onye ahu nke yiri uwe ọcha, o we were ya pua.

8. Ewe hu n'aru cherubim udi nke aka madu n'okpuru nkù-ha.

9. M'we hu, ma, le, wheel anọ di n'akuku cherubim, otù wheel di n'akuku otù cherub, otù wheel di n'akuku otù cherub: wheel ahu n'ile ha anya di ka ib͕u-maramara nkume beryl si di.

10. Ma dika ha si di n'ile ha anya, otù oyiyi ka ha anọ nwere, dika agāsi na wheel di n'etiti wheel.

11. Mb͕e ha nāga, n'akuku anọ ha ka ha nāga: ha adighi-agha anya n'azu mb͕e ha nāga, kama n'ebe ahu nke isi-ha nēche iru, n'azu ya ka ha nāga; ha adighi-agha anya n'azu mb͕e ha nāga.

12. Anu-aru nile ha na azu-ha na aka-ha na nkù-ha na wheel-ha juputara n'anya anya buruburu, ọ bu ha anọ ka wheel nile ha diri.

13. Ma wheel anọ ahu, ha ka anākpọ na ntim abua, Ihe nākpọre.

14. Ma iru anọ diri cherub ọ bula nime ha: otù iru bu iru cherub ahu, iru nke-abua bu iru madu, nke-atọ bu iru ọdum, nke-anọ bu iru ugo.

15. Cherubim we bulie onwe-ha elu: nka bu ihe ahu nke di ndu nke m'huru n'akuku osimiri Keba.

16. Ma mb͕e cherubim nāga, wheel-ha nāga n'akuku ha: ọzọ, mb͕e cherubim nāchili nkù-ha isi n'elu uwa bulie onwe-ha elu, wheel-ha adighi-esi kwa n'akuku ha chigharia.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ezikiel 10