Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ezikiel 1:9-22 Bible Nso (IGBOB)

9. ihe ejikọtara ejikọta, otù na ibe-ya, ka nkù nile ha bu; ha adighi-agha anya n'azu mb͕e ha nāga; ha nāga n'iru, onye ọ bula na ncherita-iru ya.

10. Ma oyiyi iru nile ha, iru madu ka ha nwere; iru ọdum ka ha anọ nwe-kwa-ra n'aka-nri; iru ehi ka ha anọ nwe-kwa-ra n'aka-ekpe; iru ugo ka ha anọ nwe-kwa-ra.

11. Ọzọ, iru nile ha na nkù nile ha kewara ekewa site n'elu; onye ọ bula nwere nkù abua ejikọtara ejikọta, otù na ibe-ya, ma nkù abua nēkpuchi aru-ha.

12. Ọzọ, ha nāga n'iru, onye ọ bula na ncherita-iru ya: ebe ọ bula Mọ Chineke nwere ije ka ha nāga; ha adighi-agha anya n'azu mb͕e ha nāga.

13. Ma oyiyi nke ihe anọ ahu di ndu, ka ha si di n'ile ha anya, ha di ka icheku ọku nēre ọku, dika ọwa n'ile ha anya; ọku ahu nāga iru na azu n'etiti ihe anọ ahu di ndu: onwunwu di-kwa-ra ọku ahu, àmùmà nēsi kwa n'ọku ahu b͕uputa.

14. Ihe anọ ahu di ndu nāb͕a ọsọ nālaghachi kwa dika ob͕ub͕u-àmùmà si di n'ile ya anya.

15. M'we hu ihe anọ ahu di ndu, ma, le, otù wheel di n'ala n'akuku ihe ọ bula n'ihe anọ ahu di ndu, diri iru anọ ya n'otù n'otù.

16. Ka wheel nile ahu na otú emere ha si di n'ile ha anya, ha di ka ib͕u-maramara nkume beryl: ọ bu kwa otù oyiyi ka ha anọ nwere: ka ha na otú emere ha si di n'ile ha anya, ha di ka agāsi na ọ bu wheel n'etiti wheel.

17. Ọ bu n'akuku anọ ha ka ha nāga mb͕e ha nāga: ha adighi-agha anya n'azu mb͕e ha nāga.

18. Ma azu wheel nile ha, ha di elu, ha di kwa egwu; azu wheel nile ha juputara n'anya anya buruburu ha anọ.

19. Ma mb͕e ihe anọ ahu di ndu nāga, wheel-ha nāga n'akuku ha: ọzọ, mb͕e anēsi n'elu uwa buli ihe anọ ahu di ndu, anēbuli wheel-ha.

20. Ebe ọ bula Mọ Chineke nwere ije ka ha nāga; n'ebe ahu ka Mọ Chineke nwere ije: anēbuli kwa wheel-ha n'akuku ha: n'ihi na Mọ nke ihe ahu di ndu di nime wheel-ha.

21. Mb͕e ihe anọ ahu nāga, wheel nāga; ọ bu kwa mb͕e ihe anọ ahu nēguzo ka wheel nēguzo; ọ bu kwa mb͕e anēsi n'elu uwa bulie ihe anọ ahu ka anēbuli wheel-ha n'akuku ha: n'ihi na Mọ nke ihe ahu di ndu di nime wheel-ha.

22. Ọzọ, oyiyi nke mbara-ígwé di n'elu isi ihe ahu di ndu, dika ib͕u-maramara crystal di egwu si di, nke esetiri eseti n'elu isi-ha n'elu.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ezikiel 1