Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Esta 9:5-13 Bible Nso (IGBOB)

5. Ndi-Ju we were ntib͕u mma-agha na ob͕ub͕u na ila-n'iyì tib͕ue n'etiti ndi-iro-ha nile, me ndi nākpọ ha asì dika ọ tọrọ ha.

6. Ma nime Shushan, bú ulo uku eze, ndi-Ju b͕uru nnù ndikom na ọgu ise, me ka ha la n'iyì.

7. Ha b͕u-kwa-ra Pashandata, na Dalfon, na Aspata,

8. na Porata, na Adalia, na Aridata,

9. na Pamashta, na Arisai, na Aridai, na Vaizata,

10. bú umu-ndikom iri nke Heman nwa Hamedata, bú onye nākpab͕u ndi-Ju; ma ha esetighi aka-ha n'ihe-nluta-n'agha-ha.

11. N'ubọchi ahu ọnu-ọgugu ndi eb͕uru eb͕u na Shushan, bú ulo uku eze, biaruru n'iru eze.

12. Eze we si Esta, bú nwunye eze, Nime Shushan, bú ulo uku eze, ka ndi-Ju b͕uworo nnù ndikom na ọgu ise, na umu-ndikom iri Heman, me ka ha la n'iyì; gini kwa ka ha meworo n'ala anāchi achi nke fọduru nke eze? Ma gini bu aririọ-gi? agēnye kwa gi ya: gini bu kwa ọchichọ-gi ọzọ? agēme kwa ya.

13. Esta we si, Ọ buru na ọ di eze nma, ka enye kwa ndi-Ju ike echi, bú ndi nọ na Shushan, ime dika iwu ta si di, ka akwuba kwa umu-ndikom iri Heman n'elu osisi.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Esta 9