Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Esta 9:12-25 Bible Nso (IGBOB)

12. Eze we si Esta, bú nwunye eze, Nime Shushan, bú ulo uku eze, ka ndi-Ju b͕uworo nnù ndikom na ọgu ise, na umu-ndikom iri Heman, me ka ha la n'iyì; gini kwa ka ha meworo n'ala anāchi achi nke fọduru nke eze? Ma gini bu aririọ-gi? agēnye kwa gi ya: gini bu kwa ọchichọ-gi ọzọ? agēme kwa ya.

13. Esta we si, Ọ buru na ọ di eze nma, ka enye kwa ndi-Ju ike echi, bú ndi nọ na Shushan, ime dika iwu ta si di, ka akwuba kwa umu-ndikom iri Heman n'elu osisi.

14. Eze we si ka eme ya otú a: ewe nye iwu nime Shushan; ha we kwuba umu-ndikom iri nke Heman.

15. Ndi-Ju ndi nọ na Shushan we kpọkọta kwa onwe-ha n'ubọchi nke-iri-na-anọ nke ọnwa Ada, b͕ue ọgu ndikom iri-na-ise nime Shushan; ma ha esetighi aka-ha n'ihe-nluta-n'agha-ha.

16. Ndi-Ju fọduru ndi nọ n'ala nile anāchi achi nke eze kpọkọta-kwa-ra onwe-ha, we guzo n'ihi ndu-ha, zuru ike pua n'aka ndi-iro-ha, b͕ue orú nnù ndikom uzọ iteghete na nnù asa na ọgu iri n'etiti ndi nākpọ ha asì; ma ha esetighi aka-ha n'ihe-nluta-n'agha-ha.

17. N'ubọchi nke-iri-na-atọ n'ọnwa Ada ka ha mere nka; ha we zuru ike n'ubọchi nke-iri-na-anọ nime ya, me ya ubọchi ọṅuṅu-manya-vine na ọṅù.

18. Ma ndi-Ju ndi nọ na Shushan kpọkọtara onwe-ha n'ubọchi nke-iri-na-atọ nime ya, na n'ubọchi nke-iri-na-anọ nime ya; ha we zuru ike n'ubọchi nke-iri-na-ise nime ya, me ya ubọchi ọṅuṅu-manya-vine na ọṅù.

19. N'ihi nka ndi-Ju nke obodo nile nēnweghi mb͕idi, bú ndi bi n'obodo nēnweghi mb͕idi, nēme ubọchi nke-iri-na-anọ nke ọnwa Ada ka ọ buru ubọchi ọṅù na ọṅuṅu-manya-vine, na ezi ubọchi, na ubọchi izigaritara onwe-ha òkè.

20. Mọdekai we de ihe ndia n'akwukwọ, zigara ndi-Ju nile akwukwọ, bú ndi nọ n'ala nile anāchi achi nke eze, bú Ahasuerọs, ma ndi nọ nso ma ndi nọ n'ebe di anya,

21. ime ka o guzosiri ha ike na ha ganēme ememe n'ubọchi nke-iri-na-anọ nke ọnwa Ada, na n'ubọchi nke-iri-na-ise nime ya, n'arọ nile ọ bula,

22. dika ubọchi nke ndi-Ju zuru ike nime ha pua n'aka ndi-iro-ha, na ọnwa ahu nke b͕anwere n'ebe ha nọ, isi n'ihe-nwuta ghọ ọṅù, isi kwa n'iru-újú ghọ ezi ubọchi: na ha ganēme ha ubọchi ọṅuṅu-manya-vine na nke ọṅù, na nke izigaritara onwe-ha òkè, na nke inye ndi-ob͕eye onyinye.

23. Ndi-Ju we nara ihe ahu nke ha malitere ime, na nke Mọdekai degara ha n'akwukwọ;

24. n'ihi na Heman nwa Hamedata, onye Egag, bú onye nākpab͕u ndi-Ju nile, chère èchìchè megide ndi-Ju ime ka ha la n'iyì, o we fe Pua, nke ahu bu nzà, ichusa ha, na ime ka ha la n'iyì;

25. ma mb͕e Esta batara n'iru eze, eze ji akwukwọ si ka èchìchè ọjọ ya, nke o chère megide ndi-Ju, ka o chigharikwasi n'isi-ya; ọ si kwa ka akwuba ya na umu-ya ndikom n'elu osisi.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Esta 9