Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Esta 8:7-17 Bible Nso (IGBOB)

7. Eze, bú Ahasuerọs, we si Esta, bú nwunye eze, si kwa Mọdekai, bú onye-Ju, Le, ulo Heman ka m'nyere Esta, nwoke ahu ka ha kwuba-kwa-ra n'elu osisi, n'ihi na o setiri aka-ya megide ndi-Ju.

8. Unu onwe-unu kwa, denu akwukwọ bayere ndi-Ju, dika o si di nma n'anya-unu, n'aha eze, were-kwa-nu nb͕a-aka-akàrà eze kà ya: n'ihi na odide-akwukwọ nke edeworo n'aha eze, nke ewerewo-kwa-ra nb͕a-aka-akàrà eze kà ya, ọ dighi onye puru ichighari ya.

9. Ewe kpọ ndi-ode-akwukwọ eze na mb͕e ahu, n'ọnwa nke-atọ, nke ahu bu ọnwa Sivan, n'ubọchi nke-orú-na-atọ nime ya; ewe de ya dika iwu nile si di nke Mọdekai nyere ndi-Ju, nye kwa ndi nọchiri anya eze na ndi nāchi ala na ndi-isi ala nile anāchi achi nke di site n'India we rue Etiopia, bú ọgu ala isi na asa nke anāchi achi, ala ọ bula anāchi achi dika odide-akwukwọ-ya si di, na ndi ọ bula dika asusu-ya si di, nye kwa ndi-Ju dika odide-akwukwọ-ha si di, na dika asusu-ha si di.

10. O we de akwukwọ n'aha eze, bú Ahasuerọs, were nb͕a-aka-akàrà eze kà ya, zìga akwukwọ n'aka ndi-ọb͕a-ọsọ ndi inyinya nēbu, bú ndi inyinya ukwu ọsọ na inyinya mule na umu-inyinya nēbu:

11. bú akwukwọ nke eze kwere nime ha ka ndi-Ju ndi nọ n'obodo nile ọ bula kpọkọta onwe-ha, guzo kwa n'ihi ndu-ha, ikpochapu, na ib͕u, na ime ka ha la n'iyì, bú usu-ndi-agha nile nke ndi ahu na ala ahu anāchi achi ndi nākpab͕u ha, ma umu-ntakiri-ha, ma ndinyom-ha, na iluta ihe-nkwata-ha n'agha,

12. n'ala nile anāchi achi nke eze, bú Ahasuerọs, n'otù ubọchi, bú n'ubọchi nke-iri-na-atọ nke ọnwa nke-iri-na-abua, nke ahu bu ọnwa Ada.

13. Ndeputa odide-akwukwọ, nke agēnye dika iwu n'ala nile ọ bula anāchi achi, ekpughere ya nye ndi nile di iche iche, ka ndi-Ju nọ na njikere bayere ubọchi a, ibọrọ onwe-ha ọ́bọ̀ n'iru ndi-iro-ha.

14. Ndi-ọb͕a-ọsọ ndi inyinya ukwu ọsọ na inyinya mule nēbu puru, ebe ewere okwu eze kwalie ha, me ka ha me ngwa; enye-kwa-ra iwu ahu nime Shushan, bú ulo uku eze.

15. Mọdekai we si n'iru eze pua n'uwe ala-eze nke ákwà anunu na ezi ákwà ọcha, ya na okpu-eze ọla-edo di uku, na uwe-nwuda nke ezi ákwà ọcha na ákwà ododo: obodo Shushan we tie nkpu ṅuri kwa ọṅu.

16. Ndi-Ju nwere ìhè, na ọṅù, na obi-utọ na nsọpuru.

17. N'ala nile ọ bula anāchi achi, na n'obodo nile o bula, ebe ọ bula okwu eze na iwu-ya nābiaru, ndi-Ju nwe-kwa-ra ọṅù na obi-utọ na ọṅuṅu-manya-vine na ezi ubọchi. Ọtutu madu nime ndi di iche iche nke ala ahu we nāghọ ndi-Ju; n'ihi na oké egwu ndi-Ju dakwasiri ha.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Esta 8