Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Esta 7:7-10 Bible Nso (IGBOB)

7. Eze we si n'ọṅuṅu manya-vine bilie n'ọnuma-ya je n'ubi ab͕ara ogige nke ulo-ya: ma Heman guzoro ichọ ndu-ya n'aka Esta, bú nwunye eze; n'ihi na ọ huru na eze zubesiri ihe ọjọ ike megide ya.

8. Eze we si n'ubi ab͕ara ogige nke ulo-ya biaghachi n'ulo ọṅuṅu manya-vine ahu; ma Heman adawo n'elu ihe-ndina nke Esta nọ n'elu ya. Eze we si, Ọ̀ gēweda kwa nwunye eze n'ala n'irum n'ulom? Mb͕e okwu ahu putara n'ọnu eze, ha kpuchiri iru Heman.

9. Habona, bú otù onye nime ndi-onozi ndi nọ n'iru eze, we si, Le kwa, osisi ahu nke idi-elu-ya di ọgu cubit abua na iri, nke Heman mere nye Mọdekai, bú onye kwuru ezi ihe bayere eze, o nēguzo n'ulo Heman. Eze we si, Kwubanu ya n'elu ya.

10. Ha we kwuba Heman n'elu osisi nke o doziri nye Mọdekai. Ewe me ka ọnuma eze bìe.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Esta 7