Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Esta 6:6-10 Bible Nso (IGBOB)

6. Heman we bata. Eze we si ya, Gini ka agēme nwoke ahu, bú onye nsọpuru-ya tọworo eze utọ? Heman we si n'obi-ya, Ònye ka ọ nātọ eze utọ inye nsọpuru karim?

7. Heman we si eze, Nwoke ahu nke nsọpuru-ya tọworo eze utọ,

8. ka achita uwe ala-eze nke eze yiriworo, na inyinya nke eze nọkwasiworo, na okpu-eze nke ala-eze nke ekpukwasiworo ya n'isi:

9. ka enye kwa uwe ahu na inyinya ahu n'aka otù nwoke nime ndi-isi eze, ndi bu eze, ka ha yikwasi kwa nwoke ahu nke nsọpuru-ya tọworo eze utọ, ka ha me kwa ka inyinya būru ya ga n'amá obodo, ka ha kpọ kwa n'iru ya, si, Otú a ka agēmere nwoke ahu nke nsọpuru-ya tọworo eze utọ.

10. Eze we si Heman, Me ngwa, chiri uwe ahu na inyinya ahu, dika i si kwu, me-kwa-ra Mọdekai otú a, bú onye-Ju, nke nānọdu n'ọnu-uzọ-ama eze: ka okwu ọ bula ghara idapu n'ihe nile nke i kwuworo.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Esta 6