Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Esta 5:8-14 Bible Nso (IGBOB)

8. ọ buru na ahutawom amara n'iru eze, ọ buru kwa na ọ di eze nma inye ihe m'nāriọ, na ime ihe m'nāchọ, ka eze na Heman bia n'ọṅuṅu-manya-vine nke m'gēmere ha, echi ka m'gēme kwa dika okwu eze si di.

9. Heman we pua ubọchi ahu nāṅuri ọṅu, ọ di kwa ya nma n'obi: ma mb͕e Heman huru Mọdekai n'ọnu-uzọ-ama eze, na o bilighi, na ọ maghi kwa jijiji n'iru ya, Heman juputara n'ọnuma megide Mọdekai.

10. Ma Heman jisiri onwe-ya ike, ba n'ulo-ya; o we ziga, me ka ndi nāhu ya n'anya bia, ha na Zeresh, bú nwunye-ya.

11. Heman we kọrọ ha akukọ bayere nsọpuru nke àkù-ya, na iba-uba nke umu-ya ndikom, na ihe nile nke eze ji me ka ọ di uku, nke o ji buli kwa ya ibu onye-isi nke ndi-isi na ndi-orù eze.

12. Heman we si, Ọzọ, Esta, bú nwunye eze, emeghi onye ọ bula ka o so eze bata n'ọṅuṅu-manya-vine nke o mere, ọ bu nání mu onwem; ọzọ kwa, echi ka akpọworo mu onwem jekuru ya, mu na eze.

13. Ma ihe a nile adighi-ezurum, na mb͕e nile mu onwem nāhu Mọdekai, bú onye-Ju, ka ọ nānọdu n'ọnu-uzọ-ama eze.

14. Zeresh, bú nwunye-ya, na ndi nile nāhu ya n'anya, we si ya, Ka ha me osisi nke idi-elu-ya di ọgu cubit abua na iri, ma n'ututu gi si eze ka akwuba Mọdekai n'elu-ya: gi so kwa eze ba n'ọṅuṅu-manya-vine ahu nāṅuri ọṅu. Okwu ahu we di nma n'anya Heman; o we me osisi ahu.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Esta 5