Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Esta 4:1-13 Bible Nso (IGBOB)

1. Ma Mọdekai mara ihe nile emere, Mọdekai we dọwa uwe-ya nile, yikwasi ákwà-nkpe, kpokwasi ntu n'aru-ya, pua je n'etiti obodo, tie oké nkpu di ilu:

2. o we bia rue n'iru ọnu-uzọ-ama eze: n'ihi na ọ dighi onye gābà n'ọnu-uzọ-ama eze n'uwe nke ákwà-nkpe.

3. Ọzọ, n'ala nile ọ bula anāchi achi, ebe ọ bula okwu eze na iwu-ya nābiaru, oké iru-újú ndi-Ju, na obubu-ọnu, na ikwa-ákwá, na iti-aka-n'obi; atusa-kwa-ra ákwà-nkpe na ntu n'okpuru ọtutu madu.

4. Umu-ab͕ọghọ Esta na ndi-onozi-ya we bia gosi ya; o we nēb͕u nwunye eze ahu nb͕u n'obi nke-uku; o we zìe uwe iyikwasi Mọdekai, na iwezuga ákwà-nkpe-ya n'aru-ya: ma ọ naraghi ha.

5. Esta we kpọ Hatak, bú otù onye nime ndi-onozi eze, onye eze mere ka o guzo n'iru ya, o we nye ya iwu ijekuru Mọdekai, imara ihe nka bu, na ihe kpatara nka.

6. Hatak we pukuru Mọdekai rue amá obodo ahu, nke di n'iru ọnu-uzọ-ama eze.

7. Mọdekai we gosi ya ihe nile mere ya, kọ-kwa-ra ya isi ego ahu nke Heman siri na ọ gātù nye n'ulo-àkù eze n'ihi ndi-Ju, ime ka ha la n'iyì.

8. Ọzọ, ndeputa odide-akwukwọ iwu ahu nke enyere nime Shushan ikpochapu ha, o nyere ya ya, ime ka Esta hu ya, na igosi ya; na inye ya iwu ibakuru eze, iriọ ya aririọ-amara, na ichọrọ ndi-ya ihe n'iru ya.

9. Hatak we bia gosi Esta okwu Mọdekai nile.

10. Esta we gwa Hatak okwu, nye ya iwu inye Mọdekai, si:

11. Ndi-orù nile nke eze, na ndi ala anāchi achi nke eze, mara, na nwoke ọ bula, ma-ọbu nwayi ọ bula, nke gābakuru eze, rue ogige di ime-ime, bú onye anākpọghi, otù iwu-ya bu ka eme ka ha nwua, nāgughi onye eze nēsetiri nkpa-n'aka ọla-edo, ka ọ di ndu: ma akpọghi mu onwem ibakuru eze orú ubọchi na iri ndia.

12. Ha we gosi Mọdekai okwu Esta nile.

13. Mọdekai we si ha zaghachi Esta, si, Ekwula na nkpuru-obi-gi na i gēwepuga onwe-gi n'ulo eze, kari ndi-Ju nile.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Esta 4