Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Esta 3:12-15 Bible Nso (IGBOB)

12. Ewe kpọ ndi-ode-akwukwọ eze n'ọnwa mbu, n'ubọchi nke-iri-na-atọ di nime ya, ewe de ya n'akwukwọ dika ihe nile si di nke Heman nyere ndi nọchiri anya eze n'iwu, nke o nye-kwa-ra ndi nāchi ala ndi bu ndi-isi ala ọ bula anāchi achi, nke o nye-kwa-ra ndi-isi ndi ọ bula; ala ọ bula anāchi achi dika odide-akwukwọ-ya si di, na ndi ọ bula dika asusu-ya si di; n'aha eze, bú Ahasuerọs, ka edere ya, eji-kwa-ra nb͕a-aka-akàrà eze ka ya akàrà.

13. Ewe site n'aka ndi-ọb͕a-ọsọ ziga akwukwọ n'ala nile anāchi achi nke eze, ikpochapu, na ib͕u, na ime ka ndi-Ju nile la n'iyì, site na nwata we rue okenye, ma umu-ntakiri ma ndinyom, n'otù ubọchi, n'ubọchi nke-iri-na-atọ nke ọnwa nke-iri-na-abua, nke ahu bu ọnwa Ada, na iluta ihe-nkwata-ha n'agha.

14. Ndeputa odide-akwukwọ ahu, nke agēnye dika iwu n'ala nile ọ bula anāchi achi, ekpughere ya nye ndi nile di iche iche, ka ha nọ na njikere bayere ubọchi a.

15. Ndi-ọb͕a-ọsọ puru, ebe ewere okwu eze me ka ha me ngwa, enye-kwa-ra iwu ahu nime Shushan, bú ulo uku eze: ma eze na Heman nọduru iṅu ihe-ọṅuṅu; ma ọ b͕ara obodo ahu, bú Shushan, ghari.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Esta 3