Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Esta 3:1-9 Bible Nso (IGBOB)

1. Mb͕e ihe ndia gasiri, eze, bú Ahasuerọs, mere Heman nwa Hamedata, bú onye Egag, ka ọ buru onye oku, o we bulie ya elu, do oche-eze-ya n'ebe di elu kari ndi-isi nile ya na ha nọ.

2. Ndi-orù nile nke eze, ndi nọ n'ọnu-uzọ-ama eze, we nēruru ala, nākpọ kwa isi ala nye Heman: n'ihi na otú a ka eze nyere iwu bayere ya. Ma Mọdekai adighi-eruru ala, ọ dighi-akpọ kwa isi ala nye ya.

3. Ndi-orù eze, ndi nọ n'ọnu-uzọ-ama eze, we si Mọdekai, Gini mere gi onwe-gi nāgabiga ihe eze nyere n'iwu?

4. O rue, mb͕e ha nāgwa ya okwu kwa-ubọchi, ma ọ geghi nti ha, na ha gosiri Heman, ihu ma okwu Mọdekai gēguzo: n'ihi na o gosiri ha na ya onwe-ya bu onye-Ju.

5. Heman we hu na Mọdekai adighi-eruru ala, na ọ dighi-akpọ kwa isi ala nye ya, Heman we juputa n'ọnuma.

6. O we buru ihe-nleda-anya n'anya-ya iseti aka megide Mọdekai, nání ya; n'ihi na ha gosiri ya ndi Mọdekai: Heman we chọ ikpochapu ndi-Ju nile ndi nọ n'ala-eze nile nke Ahasuerọs, bú ndi Mọdekai.

7. N'ọnwa mbu, nke ahu bu ọnwa Nisan, n'arọ nke-iri-na-abua nke eze, bú Ahasuerọs, ka ha fere Pua, nke ahu bu nzà, n'iru Heman, site n'otù ubọchi rue ubọchi ọzọ, site kwa n'otù ọnwa ọzọ, rue ọnwa nke-iri-na-abua, nke ahu bu ọnwa Ada.

8. Heman we si eze, bú Ahasuerọs, Otù ndi di ndi emeworo ka ha b͕asa, ndi ekesawo-kwa-ra ha n'etiti ndi di iche iche n'ala nile anāchi achi nke ala-eze-gi; iwu nile ha di kwa iche n'iwu ndi ọ bula; ha adighi-edebe kwa iwu nile nke eze: o kwesighi kwa eze ka o kwe ka ha nọduru onwe-ha.

9. Ọ buru na ọ di eze nma, ka ede ya n'akwukwọ ime ka ha la n'iyì: m'gātù kwa orú nnù talent ọla-ọcha na nnù ise nye n'aka ndi nēje ozi a, iwebata ya n'ulo-àkù eze.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Esta 3