Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Esta 2:6-19 Bible Nso (IGBOB)

6. onye emere ka o si na Jerusalem je biri n'ala ọzọ n'etiti ndi emere ka ha je biri n'ala ọzọ, bú ndi emere ha na Jekonaia, bú eze Juda, ka ha je biri n'ala ọzọ, onye Nebukadneza, bú eze Babilon, mere ka ọ je biri n'ala ọzọ.

7. O we nāzùlite Hadasa, nke ahu bu Esta, nwa-nwayi nwa-nne nna-ya: n'ihi na o nweghi nna ma-ọbu nne, ma nwa-ab͕ọghọ ahu mara nma n'aru, di kwa nma ile anya; mb͕e nna-ya na nne-ya nwuru, Mọdekai we kuru ya onwe-ya ka ọ buru nwa-ya nwayi.

8. O rue, mb͕e anuru okwu eze na iwu-ya, mb͕e achikọbata-kwa-ra ọtutu umu-ab͕ọghọ nime Shushan, bú ulo uku eze, rue aka Hegai, na ekubatara Esta n'ulo eze, rue aka Hegai, onye nēdebe ndinyom.

9. Nwa-ab͕ọghọ ahu we di nma n'anya-ya, ewe mere ya ebere n'iru ya; o we me ngwa inye ya ihe-nsacha-ya nile, na òkè-ya nile, na umu-ab͕ọghọ asa ahu ndi eleputaworo n'ulo eze ka enye ya ha: o we wegharia ya na umu-ab͕ọghọ-ya n'ulo kachasi nma nke ndinyom.

10. Esta egosighi ndi-ya ma-ọbu umu-nna-ya: n'ihi na Mọdekai nyere ya iwu ka ọ ghara igosi ha.

11. Mọdekai we nējeghari n'iru ogige ulo ndinyom n'ubọchi nile ọ bula, imara udo Esta, na ihe agēme ya.

12. Ma mb͕e orúrú nwa-ab͕ọghọ ọ bula biaruru nso ibakuru eze, bú Ahasuerọs, mb͕e ọnwa iri na abua gwusiri ya, dika iwu ndinyom si di, (n'ihi na otú a ka anēmezu ubọchi nsacha-ha, bú ọnwa isi iji manu myrrh, na ọnwa isi iji uda di iche iche na iji ihe-nsacha ndinyom,)

13. nwa-ab͕ọghọ ahu we biakute eze n'uzọ di otú a, anēnye ya ihe ọ bula ọ nāsi ha nye, iso ya si n'ulo ndinyom biarue ulo eze.

14. N'anyasi ka nwayi ahu batara, n'ututu ka nwayi ahu laghachi-kwa-ra n'ulo nke-abua nke ndinyom, rue aka Shaashgaz, bú onozi eze, onye nēdebe ndi-iko-nwayi: ọ dighi-abiakute eze ọzọ, ma-ọbughi na ihe-ya tọrọ eze utọ, ewe kpọ ya n'aha.

15. Ma mb͕e orúrú Esta, bú nwa-nwayi Abihail nwa-nne nna Mọdekai, onye kuru ya n'onwe-ya ka ọ buru nwa-ya nwayi, biaruru ibakuru eze, ọ chọghi ihe, ọ bu nání ihe Hegai, bú onozi eze, onye nēdebe ndinyom, nāsi ya. Esta we nānata amara n'anya ndi nile nāhu ya anya.

16. Ewe kuru Esta jekuru eze, bú Ahasuerọs, rue ulo ala-eze ya, n'ọnwa nke-iri, nke ahu bu ọnwa Tebet, n'arọ nke-asa nke ọbubu-eze-ya.

17. Eze we hu Esta n'anya kari ndinyom ahu nile, o we nata amara na ebere n'iru ya kari umu-ab͕ọghọ ahu nile ndi nāmaghi nwoke; o we tukwasi okpu-eze ala-eze n'isi-ya, me ya nwunye eze n'ọnọdu Vashti.

18. Eze we mere ndi-isi-ya na ndi-orù-ya nile oké ọṅuṅu-manya-vine, bú ọṅuṅu-manya-vine, Esta; o me-kwa-ra ka ala nile anāchi achi zuru ike n'itu utu, o we nye onyinye, dika aka eze ruru.

19. Ma mb͕e achikọtara ha nke ub͕ò abua, bú umu-ab͕ọghọ nāmaghi nwoke, Mọdekai we nānọdu n'ọnu-uzọ-ama eze.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Esta 2