Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Esta 2:16-23 Bible Nso (IGBOB)

16. Ewe kuru Esta jekuru eze, bú Ahasuerọs, rue ulo ala-eze ya, n'ọnwa nke-iri, nke ahu bu ọnwa Tebet, n'arọ nke-asa nke ọbubu-eze-ya.

17. Eze we hu Esta n'anya kari ndinyom ahu nile, o we nata amara na ebere n'iru ya kari umu-ab͕ọghọ ahu nile ndi nāmaghi nwoke; o we tukwasi okpu-eze ala-eze n'isi-ya, me ya nwunye eze n'ọnọdu Vashti.

18. Eze we mere ndi-isi-ya na ndi-orù-ya nile oké ọṅuṅu-manya-vine, bú ọṅuṅu-manya-vine, Esta; o me-kwa-ra ka ala nile anāchi achi zuru ike n'itu utu, o we nye onyinye, dika aka eze ruru.

19. Ma mb͕e achikọtara ha nke ub͕ò abua, bú umu-ab͕ọghọ nāmaghi nwoke, Mọdekai we nānọdu n'ọnu-uzọ-ama eze.

20. Esta adighi-egosi umu-nna-ya ma-ọbu ndi-ya; dika Mọdekai nyere ya iwu: n'ihi na ihe Mọdekai siri, nke ahu ka Esta nēme, dika mb͕e anāzùlite ya n'aka-ya.

21. Na mb͕e ahu, mb͕e Mọdekai nānọdu n'ọnu-uzọ-ama eze, Bigtan na Teresh, bú ndi-nchedo abua nke eze, nime ndi nēche nbata-uzọ, were iwe, chọ iseti aka megide eze, bú Ahasuerọs.

22. Mọdekai we mata ihe ahu, o we gosi Esta, bú nwunye eze; Esta we gwa eze n'aha Mọdekai.

23. Ewe jua ase okwu ahu, chọputa ya, ewe kwuba ha abua n'osisi: ewe de ya n'akwukwọ ihe emere n'ubọchi ahu n'iru eze.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Esta 2