Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Esta 2:13-23 Bible Nso (IGBOB)

13. nwa-ab͕ọghọ ahu we biakute eze n'uzọ di otú a, anēnye ya ihe ọ bula ọ nāsi ha nye, iso ya si n'ulo ndinyom biarue ulo eze.

14. N'anyasi ka nwayi ahu batara, n'ututu ka nwayi ahu laghachi-kwa-ra n'ulo nke-abua nke ndinyom, rue aka Shaashgaz, bú onozi eze, onye nēdebe ndi-iko-nwayi: ọ dighi-abiakute eze ọzọ, ma-ọbughi na ihe-ya tọrọ eze utọ, ewe kpọ ya n'aha.

15. Ma mb͕e orúrú Esta, bú nwa-nwayi Abihail nwa-nne nna Mọdekai, onye kuru ya n'onwe-ya ka ọ buru nwa-ya nwayi, biaruru ibakuru eze, ọ chọghi ihe, ọ bu nání ihe Hegai, bú onozi eze, onye nēdebe ndinyom, nāsi ya. Esta we nānata amara n'anya ndi nile nāhu ya anya.

16. Ewe kuru Esta jekuru eze, bú Ahasuerọs, rue ulo ala-eze ya, n'ọnwa nke-iri, nke ahu bu ọnwa Tebet, n'arọ nke-asa nke ọbubu-eze-ya.

17. Eze we hu Esta n'anya kari ndinyom ahu nile, o we nata amara na ebere n'iru ya kari umu-ab͕ọghọ ahu nile ndi nāmaghi nwoke; o we tukwasi okpu-eze ala-eze n'isi-ya, me ya nwunye eze n'ọnọdu Vashti.

18. Eze we mere ndi-isi-ya na ndi-orù-ya nile oké ọṅuṅu-manya-vine, bú ọṅuṅu-manya-vine, Esta; o me-kwa-ra ka ala nile anāchi achi zuru ike n'itu utu, o we nye onyinye, dika aka eze ruru.

19. Ma mb͕e achikọtara ha nke ub͕ò abua, bú umu-ab͕ọghọ nāmaghi nwoke, Mọdekai we nānọdu n'ọnu-uzọ-ama eze.

20. Esta adighi-egosi umu-nna-ya ma-ọbu ndi-ya; dika Mọdekai nyere ya iwu: n'ihi na ihe Mọdekai siri, nke ahu ka Esta nēme, dika mb͕e anāzùlite ya n'aka-ya.

21. Na mb͕e ahu, mb͕e Mọdekai nānọdu n'ọnu-uzọ-ama eze, Bigtan na Teresh, bú ndi-nchedo abua nke eze, nime ndi nēche nbata-uzọ, were iwe, chọ iseti aka megide eze, bú Ahasuerọs.

22. Mọdekai we mata ihe ahu, o we gosi Esta, bú nwunye eze; Esta we gwa eze n'aha Mọdekai.

23. Ewe jua ase okwu ahu, chọputa ya, ewe kwuba ha abua n'osisi: ewe de ya n'akwukwọ ihe emere n'ubọchi ahu n'iru eze.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Esta 2