Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Esta 2:1-10 Bible Nso (IGBOB)

1. Mb͕e ihe ndia gasiri, mb͕e ọnuma eze, bú Ahasuerọs, bìri, ọ chetara Vashti, na ihe o mere, na ihe ekwubìri megide ya.

2. Ndi-ozi eze, bú ndi nējere ya ozi, we si ya, Ka ha chọrọ eze umu-ab͕ọghọ ndi nāmaghi nwoke, bú ndi di nma ile anya:

3. ka eze me kwa ndi-nlekọta n'ala nile anāchi achi nke ala-eze-ya, ka ha we chikọta umu-ab͕ọghọ nile ndi nāmaghi nwoke, bú ndi di nma ile anya, rue Shushan, bú ulo uku eze, rue ulo ndinyom, rue aka Hege, bú onozi eze, onye nēdebe ndinyom; ka enye kwa ha ihe-nsacha nile ha:

4. ka nwa-ab͕ọghọ nke di nma n'anya eze buru nwunye eze n'ọnọdu Vashti. Ihe ahu we di nma n'anya eze; o we me otú a.

5. Otù nwoke, bú onye-Ju, nọ na Shushan, bú ulo uku eze, aha-ya bu Mọdekai, nwa Jaia, nwa Shimai, nwa Kish, bú onye Benjamin;

6. onye emere ka o si na Jerusalem je biri n'ala ọzọ n'etiti ndi emere ka ha je biri n'ala ọzọ, bú ndi emere ha na Jekonaia, bú eze Juda, ka ha je biri n'ala ọzọ, onye Nebukadneza, bú eze Babilon, mere ka ọ je biri n'ala ọzọ.

7. O we nāzùlite Hadasa, nke ahu bu Esta, nwa-nwayi nwa-nne nna-ya: n'ihi na o nweghi nna ma-ọbu nne, ma nwa-ab͕ọghọ ahu mara nma n'aru, di kwa nma ile anya; mb͕e nna-ya na nne-ya nwuru, Mọdekai we kuru ya onwe-ya ka ọ buru nwa-ya nwayi.

8. O rue, mb͕e anuru okwu eze na iwu-ya, mb͕e achikọbata-kwa-ra ọtutu umu-ab͕ọghọ nime Shushan, bú ulo uku eze, rue aka Hegai, na ekubatara Esta n'ulo eze, rue aka Hegai, onye nēdebe ndinyom.

9. Nwa-ab͕ọghọ ahu we di nma n'anya-ya, ewe mere ya ebere n'iru ya; o we me ngwa inye ya ihe-nsacha-ya nile, na òkè-ya nile, na umu-ab͕ọghọ asa ahu ndi eleputaworo n'ulo eze ka enye ya ha: o we wegharia ya na umu-ab͕ọghọ-ya n'ulo kachasi nma nke ndinyom.

10. Esta egosighi ndi-ya ma-ọbu umu-nna-ya: n'ihi na Mọdekai nyere ya iwu ka ọ ghara igosi ha.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Esta 2