isiakwụkwọ

  1. 1
  2. 2
  3. 3
  4. 4
  5. 5
  6. 6
  7. 7
  8. 8
  9. 9
  10. 10

Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Esta 10 Bible Nso (IGBOB)

1. Eze, bú Ahasuerọs, we me ka ala ahu na ala nile nke di oké osimiri buruburu tua utu.

2. Ma ọlu nile nke ike-ya na nke idi-ike-ya, na ọkukọ-isi nke idi-uku nke Mọdekai, bú nke eze mere ya ka ọ di uku, èdeghi ihe ndia n'akwukwọ ihe emere n'ubọchi nke ndi-eze Midia na Peasia?

3. N'ihi na Mọdekai, bú onye-Ju, nọsoro eze, bú Ahasuerọs, ọ di kwa uku n'etiti ndi-Ju, na onye ihe-ya tọrọ ọtutu umu-nne-ya utọ; ọ nāchọrọ ndi-ya ọdi-nma, nāgwa kwa nkpuru-ya nile okwu udo.