Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Esta 1:8-22 Bible Nso (IGBOB)

8. Ọṅuṅu-ihe ahu di ka iwu si di; ọ dighi onye nērugide erugide: n'ihi na otú a ka eze nyere onye uku ọ bula nke ulo-ya iwu, ime dika ọ tọrọ nwoke ọ bula utọ.

9. Vashti, bú nwunye eze, me-kwa-ra ọṅuṅu-manya-vine nye ndinyom n'ulo ala-eze nke eze, bú Ahasuerọs, nwere.

10. N'ubọchi nke-asa, mb͕e obi eze di nma site na manya-vine, ọ siri Mehuman, na Bizta, na Habona, na Bigta, na Abagta, na Zeta, na Kakas, bú ndi-onozi asa ndi nēje ozi n'iru eze, bú Ahasuerọs,

11. ka ha me ka Vashti, bú nwunye eze, bia n'iru eze nēkpu okpu-eze nke ala-eze, ime ka ndi di iche iche na ndi-isi hu nma-ya: n'ihi na nwayi nke di nma ile anya ka ọ bu.

12. Nwunye eze, bú Vashti, we ju ibia n'okwu eze nke sitere n'aka ndi-onozi: eze we we iwe nke-uku, ọnuma-ya nēre ọku nime ya.

13. Eze we si ndi mara ihe, bú ndi mara mb͕e di iche iche, (n'ihi na otú a ka okwu eze di n'iru ndi nile mara iwu na ikpé;

14. ma onye nọ nso ya bu Kashena, ya na Sheta, na Admata, na Tashish, na Meres, na Masena, na Memukan, bú ndi-isi asa nke Peasia na Midia, ndi nāhu iru eze, ndi nānọ n'isi n'ala-eze:)

15. Dika iwu si di, gini ka agēme nwunye eze, bú Vashti, n'ihi na o meghi ihe eze, bú Ahasuerọs, siri ya site n'aka ndi-onozi?

16. Memukan we kwue n'iru eze na ndi-isi, si, Ọ bughi eze, nání ya, ka Vashti, bú nwunye eze, mere ajọ omume megide, kama megide ndi-isi nile, megide kwa ndi di iche iche nile ndi nọ n'ala nile anāchi achi nke eze, bú Ahasuerọs.

17. N'ihi na okwu a bayere nwunye eze gāpu rue nti ndinyom nile, ime ka di-ha buru ihe anēleda eleda n'anya-ha, mb͕e ha nāsi, Eze, bú Ahasuerọs, siri ka eme Vashti, bú nwunye eze, ka ọ bia n'iru ya, ma ọ biaghi.

18. Ubọchi ta ka ndinyom ndi-isi nke Peasia na Midia, bú ndi nuworo okwu a bayere nwunye eze, gāsi kwa ndi-isi nile nke eze otú a, nleda-anya na iwe nke zuru ezu gāputa kwa.

19. Ọ buru na ọ di eze nma, ka okwu ala-eze si n'iru ya pua, ka ede kwa ya n'akwukwọ n'etiti iwu Peasia na Media, o we ghara igabiga, ka Vashti ghara ibia ọzọ n'iru eze, bú Ahasuerọs; ka eze nye kwa nwayi-ibe-ya nke ka ya nma ọnọdu-nwunye-eze-ya.

20. Agēme kwa ka anu iwu eze, bú nke ọ nēme, n'ala-eze-ya nile, (n'ihi na ihe bara uba ka ọ bu,) ndinyom nile gēnye di-ha nsọpuru, site n'onye uku we rue onye ntà.

21. Okwu ahu we di nma n'anya eze na ndi-isi-ya; eze we me dika okwu Memukan si di:

22. o we ziga akwukwọ n'ala nile anāchi achi nke eze, n'ala ọ bula anāchi achi dika odide-akwukwọ-ya si di, ziga-kwa-ra ndi ọ bula dika asusu-ya si di, na nwoke ọ bula gābu onye-isi n'ulo-ya, na ọ ganēkwu kwa ya dika asusu ndi-ya si di.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Esta 1