Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Esta 1:19-22 Bible Nso (IGBOB)

19. Ọ buru na ọ di eze nma, ka okwu ala-eze si n'iru ya pua, ka ede kwa ya n'akwukwọ n'etiti iwu Peasia na Media, o we ghara igabiga, ka Vashti ghara ibia ọzọ n'iru eze, bú Ahasuerọs; ka eze nye kwa nwayi-ibe-ya nke ka ya nma ọnọdu-nwunye-eze-ya.

20. Agēme kwa ka anu iwu eze, bú nke ọ nēme, n'ala-eze-ya nile, (n'ihi na ihe bara uba ka ọ bu,) ndinyom nile gēnye di-ha nsọpuru, site n'onye uku we rue onye ntà.

21. Okwu ahu we di nma n'anya eze na ndi-isi-ya; eze we me dika okwu Memukan si di:

22. o we ziga akwukwọ n'ala nile anāchi achi nke eze, n'ala ọ bula anāchi achi dika odide-akwukwọ-ya si di, ziga-kwa-ra ndi ọ bula dika asusu-ya si di, na nwoke ọ bula gābu onye-isi n'ulo-ya, na ọ ganēkwu kwa ya dika asusu ndi-ya si di.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Esta 1