Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Esta 1:1-15 Bible Nso (IGBOB)

1. O rue, n'ubọchi Ahasuerọs, (nka bu Ahasuerọs nke bu eze ọgu ala anāchi achi na asa, site n'India we rue Etiopia:)

2. na mb͕e ahu, mb͕e eze, bú Ahasuerọs, nọkwasiri n'oche-eze ala-eze-ya, nke di na Shushan, bú ulo uku eze,

3. n'arọ nke-atọ nke ọbubu-eze-ya, na o mere ọṅuṅu-manya-vine nye ndi-isi-ya na ndi-orù-ya; ndi bu dìnkpà nke Peasia na Midia, bú ndi-eze na ndi-isi nke ala nile anāchi achi, nọ n'iru ya:

4. mb͕e o mere ka ahú àkù nke nsọpuru ala-eze-ya na ọkaka nke ima-nma nke idi-uku-ya ọtutu ubọchi, bú ọgu ubọchi iteghete.

5. Ma mb͕e emezuru ubọchi ndia, eze mere ọṅuṅu-manya-vine nye ndi nile ndi ahuru na Shushan, bú ulo uku eze, site n'onye uku we rue onye ntà, ubọchi asa, n'ogige nke ubi ab͕ara ogige nke ulo eze;

6. ihe-nkwuba di nke ezi ákwà ọcha na ogho ọcha na ogho anunu, nke eji udọ̀ nke ezi ákwà ọcha na ogho ododo kekọta ha na nb͕a-aka ọla-ọcha na ogidi marble: ihe-ndina bu ọla-edo na ọla-ọcha, n'elu pavement eji marble uhie, na nke ọcha, na nke edo, na nke oji, me.

7. Ha me-kwa-ra ka ha ṅua ihe-ọṅuṅu n'ihe ọla-edo, (ihe nile di kwa iche iche,) manya-vine nke ala-eze ba-kwa-ra uba, dika aka eze ruru.

8. Ọṅuṅu-ihe ahu di ka iwu si di; ọ dighi onye nērugide erugide: n'ihi na otú a ka eze nyere onye uku ọ bula nke ulo-ya iwu, ime dika ọ tọrọ nwoke ọ bula utọ.

9. Vashti, bú nwunye eze, me-kwa-ra ọṅuṅu-manya-vine nye ndinyom n'ulo ala-eze nke eze, bú Ahasuerọs, nwere.

10. N'ubọchi nke-asa, mb͕e obi eze di nma site na manya-vine, ọ siri Mehuman, na Bizta, na Habona, na Bigta, na Abagta, na Zeta, na Kakas, bú ndi-onozi asa ndi nēje ozi n'iru eze, bú Ahasuerọs,

11. ka ha me ka Vashti, bú nwunye eze, bia n'iru eze nēkpu okpu-eze nke ala-eze, ime ka ndi di iche iche na ndi-isi hu nma-ya: n'ihi na nwayi nke di nma ile anya ka ọ bu.

12. Nwunye eze, bú Vashti, we ju ibia n'okwu eze nke sitere n'aka ndi-onozi: eze we we iwe nke-uku, ọnuma-ya nēre ọku nime ya.

13. Eze we si ndi mara ihe, bú ndi mara mb͕e di iche iche, (n'ihi na otú a ka okwu eze di n'iru ndi nile mara iwu na ikpé;

14. ma onye nọ nso ya bu Kashena, ya na Sheta, na Admata, na Tashish, na Meres, na Masena, na Memukan, bú ndi-isi asa nke Peasia na Midia, ndi nāhu iru eze, ndi nānọ n'isi n'ala-eze:)

15. Dika iwu si di, gini ka agēme nwunye eze, bú Vashti, n'ihi na o meghi ihe eze, bú Ahasuerọs, siri ya site n'aka ndi-onozi?

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Esta 1