isiakwụkwọ

  1. 1
  2. 2
  3. 3
  4. 4
  5. 5
  6. 6
  7. 7
  8. 8
  9. 9

Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Emos 4 Bible Nso (IGBOB)

1. Nurunu okwu a, unu nne-ehi nke Beshan, ndi nọ n'ugwu Sameria, ndi nēmeb͕u ndi nēnweghi ike, ndi nāzọpia umu-ob͕eye, ndi nāsi ndi-nwe-ha, Wetanu, ka ayi ṅua.

2. Onye-nwe-ayi Jehova ejiwo idi-nsọ-Ya ṅua iyi, si, na le, ubọchi nābiakwasi unu, mb͕e agāchiri nkò bupu unu, chiri kwa nkò azù bupu ndi-unu fọduru.

3. Ọ bu kwa ntipú-mb͕idi di iche iche ka unu gēsi pua, nwanyi ọ bula na ncherita-iru ya; unu gātubà onwe-unu na Hamon; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.

4. Bianu na Bet-el, jehie; bianu na Gilgal, me ka njehie ba uba; chibata-kwa-nu ihe-àjà-unu kwa-ututu, chibata ihe nile bu otù uzọ n'uzọ iri unu kwa ubọchi atọ;

5. sure-kwa-nu àjà-ekele dika ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ site n'achicha ekoro eko, kpọsa-kwa-nu onyinye-afọ-ofufo di iche iche, me ka anuru ihe bayere ha: n'ihi na ihe di otú a ka unu huworo n'anya, umu Israel; ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta.

6. Mu onwem kwa, enyewom unu ezé nwuru enwu n'obodo nile unu, na ukọ nri n'ebe nile unu: ma unu alaghachikuteghm; ọ bu ihe si n'ọnu jehova puta.

7. Ọzọ kwa, Mu onwem eb͕ochiworo unu oké miri-ozuzo, mb͕e ọnwa atọ fọduru iru mb͕e owuwe-ihe-ubi: eme-kwa-ram ka o zokwasi otù obodo, ma adighm-eme ka o zokwasi obodo ọzọ: otù òkè ala-ubi ka o nēzokwasi, ma òkè ala-ubi ahu nke ọ nādighi-ezokwasi nākpọnwu akpọnwu.

8. Obodo abua ma-ọbu atọ ewe ṅagharia rue otù obodo iṅu miri, ma ha adighi-aṅuju afọ: ma unu alaghachikuteghm; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.

9. Ejirim nchakpọ, ji kwa ọmuma-ebù, tib͕ue unu: ka ha rà, bú ubi-unu ab͕ara ogige, na ubi-vine-unu, na osisi fig unu, na osisi olive unu, palmer-worm nērichapu ha: ma unu alaghachikuteghm; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.

10. Ezitewom ajọ ọria nēfe efe n'etiti unu n'uzọ o si eme n'Ijipt: eb͕uwom umu-okorọbia-unu na mma-agha, ha na inyinya nile unu adọtara n'agha; M'we me ka ísì ọjọ nke ọmuma-ulo-ikwū-unu rigota ọbuná n'imi-unu: ma unu alaghachikuteghm; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.

11. Akwatuwom ufọdu n'etiti unu, dika mb͕e Chineke kwaturu Sọdọm na Gọmọra, unu we di ka ọlọkọ-ọku alọputara n'orire-ọku: ma unu alaghachikuteghm; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.

12. N'ihi nka ka M'gēme gi otú a, gi Israel: ebe ọ bu nka ka M'gēme gi, jikere izute Chineke-gi, gi Israel.

13. N'ihi na, le, Onye nākpu ugwu nile, Nke nēkè kwa ifufe, Nke nēgosi kwa madu ihe bu ntughari-uche-ya, Onye nēme chi-ọbubọ ka ọ b͕a oké ọchichiri, Nke nāzọkwasi kwa ebe nile di elu nke uwa; Jehova, bú Chineke nke usu nile nke ndi-agha, bu aha-Ya.