8. ọ bu kwa n'elu uwe anaraworo n'ihe-ibe ka ha nēseti onwe-ha n'akuku ebe-ichu-aja nile ọ bula, ọ bu kwa manya-vine nke ndi eriworo ha nra ka ha nāṅu n'ulo Chineke-ha.
9. Ma Mu onwem kpochapuru ndi-Amorait n'iru ha, onye idi-elu-ya di ka idi-elu osisi cedar, onye di ike ka ọ bu kwa, dika osisi oak; ma ekpochapurum nkpuru-ya n'elu na nkpọrọgwu-ya nile n'okpuru.
10. Ọ bu kwa Mu onwem mere ka unu si n'ala Ijipt rigoputa, M'me-kwa-ra ka unu je ije n'ọzara ọgu arọ abua, ka unu we nweta ala ndi-Amorait.
11. Eme-kwa-ram ka ufọdu nime umu-unu bilie ibu ndi-amuma, ufọdu nime umu-okorọbia-unu kwa, ibu ndi-Nazirait. Ọ̀ bughi nọ̄ ezie, bú nka, unu umu Israel? Ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.
12. Unu we me ka ndi-Nazirait ṅua manya-vine; ọ bu kwa ndi-amuma ka unu nyere iwu, si, Unu ebula amuma.
13. Le, Mu onwem gābiada unu n'ọnọdu-unu, dika ub͕ọ-ala nke juputara n'ùkwù ọka si abiada.
14. Ebe-nb͕alaga gālanari kwa onye ukwu ọsọ n'iyì, onye di ike agaghi-ab͕a kwa ike-ya ume, dike agaghi-ewepuga onwe-ya:
15. onye nāchi uta agaghi-eguzo kwa; onye ukwu-ya abua di nfe n'ib͕a ọsọ agaghi-ewepuga kwa onwe-ya: onye nānọkwasi n'inyinya agaghi-ewepuga kwa onwe-ya: