isiakwụkwọ

  1. 1
  2. 2
  3. 3
  4. 4
  5. 5
  6. 6
  7. 7
  8. 8
  9. 9

Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Emos 1 Bible Nso (IGBOB)

1. Okwu Emos, onye nọ n'etiti ndi-nche-anu-ulo nke Tekoa, nke ọ huru bayere Israel n'ubọchi Uzaia, bú eze Juda, na n'ubọchi Jeroboam nwa Joash, bú eze Israel, arọ abua tutu ala-ọma-jijiji.

2. Ọ we si, Jehova gēsi na Zaion bib͕ọ, me ka olu-Ya si na Jerusalem da; ebe-ita-nri nile nke ndi-ọzùzù-aturu ewe ru újú, elu Kamel gākpọnwu kwa.

3. Otú a ka Jehova siri: N'ihi njehie atọ nke Damaskọs, e, n'ihi anọ, ka M'nāgaghi-eme ka ahuhu-ya laghachi azu; n'ihi na ha ewerewo ígwè eji azọcha ọka zọcha Gilead:

4. ma M'gēzite ọku n'ulo Hazael, ọ gēripia kwa ulo-elu nile nke Ben-hedad.

5. M'gētiji kwa nkpọrọ Damaskọs, si na ndagwurugwu Even bipu onye bi ya, si kwa n'ulo Eden bipu onye nējide nkpa-n'aka-eze: agēme kwa ka ndi Siria je biri n'ala ọzọ, bú Kia; otú a ka Jehova siri.

6. Otú a ka Jehova siri: N'ihi njehie atọ nke Geza, e, n'ihi anọ, ka M'nāgaghi-eme ka ahuhu-ya laghachi azu; n'ihi na ha mere ka otù ndi je biri n'ala ọzọ, ha nile, imechibido ha nye n'aka Edom:

7. ma M'gēzite ọku n'elu mb͕idi Geza, ọ gēripia kwa ulo-elu-ya nile:

8. M'gēsi kwa n'Ashdad bipu onye bi ya, si kwa n'Ashkelon bipu onye nējide nkpa-n'aka-eze; M'gēchighari kwa akam imegide Ekron, ndi Filistia ndi fọduru gāla kwa n'iyì; otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri.

9. Otú a ka Jehova siri: N'ihi njehie atọ nke Taia, e, n'ihi anọ ka M'nāgaghi-eme ka ahuhu-ya laghachi azu; n'ihi na ha mechibidoro otù ndi emere ka ha nile je biri n'ala ọzọ nye n'aka Edom, ha echetaghi kwa ọb͕ub͕a-ndu nke umu-nne:

10. ma M'gēzite ọku n'elu mb͕idi Taia, o gēripia kwa ulo-elu-ya nile.

11. Otú a ka Jehova siri: N'ihi njehie atọ nke Edom, e, n'ihi anọ, ka M'nāgaghi-eme ka ahuhu-ya laghachi azu; n'ihi na o jiri mma-agha chu nwa-nne-ya, o bibi-kwa-ra obi-ebere-ya nile, iwe-ya we nādọka rue mb͕e ebighi-ebi, ma nrubiga-ókè nke iwe-Ya, o debewo ya mb͕e ebighi-ebi:

12. ma M'gēzite ọku na Timan, o gēripia kwa ulo-elu nile nke Bọzra.

13. Otú a ka Jehova siri: N'ihi njehie atọ nke umu Amon, e, n'ihi anọ, ka M'nāgaghi-eme ka ahuhu-ya laghachi; n'ihi na ha ab͕awawo ndinyom Gilead di ime afọ ka ha we me ka ókè-ala-ha sa mbara:

14. ma M'gēsuye ọku na mb͕idi Raba, ọ gēripia kwa ulo-elu-ya nile, n'iti-nkpu agha n'ubọchi agha, n'oké ifufe n'ubọchi oké ikuku:

15. eze-ha gāla kwa n'etiti ndi emere ka ha je biri n'ala ọzọ, ya onwe-ya na ndi-isi-ya n'otù; otú a ka Jehova siri.