Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Eklisiastis 9:13-18 Bible Nso (IGBOB)

13. Otú a kwa ka m'huworo amam-ihe n'okpuru anyanwu, ihe uku ka ọ burum:

14. otù obodo ntà di, ndikom di nime ya di kwa ole-na-ole; ma otù eze uku biara imegide ya, we b͕a ya buruburu, wu kwa ebe ewusiri ike imegide ya:

15. ma achọputara nime ya otù nwoke bu ob͕eye nke mara ihe, onye ahu we me ka obodo ahu wepuga onwe-ya site n'amam-ihe-ya; ma madu echetaghi nwoke ahu bu ob͕eye.

16. Mu onwem we si, Amam-ihe di nma kari idi-ike: ma amam-ihe nke ob͕eye ahu bu ihe anēleda anya, adighi-anu kwa okwu-ya nile.

17. Okwu nke ndi mara ihe anēkwu na nwayọ, anānu ha kari iti-nkpu nke onye nāchi achi n'etiti ndi-nzuzu.

18. Amam-ihe di nma kari ihe-agha nile: ma otù onye-nmehie nāla ọtutu ezi ihe n'iyì.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Eklisiastis 9