Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Eklisiastis 7:16-24 Bible Nso (IGBOB)

16. Abubigala onye ezi omume ókè; eme-kwa-la onwe-gi onye mabigara ihe ókè: n'ìhi gini ka i gēmebi onwe-gi?

17. Emebibigala iwu ókè, abu-kwa-la onye-nzuzu: n'ìhi gini ka i gānwuchu anwuchu?

18. Ọ di nma ka i jide nka; ọzọ kwa, esepula aka-gi na nka: n'ihi na onye nātu egwu Chineke gāputa n'etiti ha nile.

19. Amam-ihe nēme ka onye mara ihe di ike kari madu iri ndi nāchi achi ndi nọ n'obodo.

20. N'ezie ọ dighi onye ezi omume n'uwa, nke nēme ezi ihe, nādighi-emehie kwa.

21. Ọzọ, atukwasila obi-gi n'okwu nile anēkwu; ka i we ghara inu ka orù-gi nākọcha gi:

22. N'ihi na ọtutu mb͕e obi-gi maworo na gi onwe-gi akọchawo ndi ọzọ.

23. Ihe nile a ka m'nwaworo n'amam-ihe: m'siri, M'gāma ihe; ma nke ahu di anya n'ebe m'nọ.

24. Ọ di anya, bú ihe nke diworo, o mi-kwa-ra emi nke-uku; ònye gāchọputa ya?

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Eklisiastis 7