Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Eklisiastis 7:14-17 Bible Nso (IGBOB)

14. N'ubọchi ọdi-nma-gi nọ n'ọdi-nma, ma n'ubọchi ọdi-njọ le anya: ọbuná otù na nso ibe-ya ka Chineke meworo ha, ka madu we ghara ichọputa ihe ọ bula nke gādi mb͕e ọ gasiri.

15. Ihe nile a ka m'huworo n'ubọchi nile nke ihe-efum: onye ezi omume di nke nāla n'iyì n'ezi omume-ya, onye nēmebi iwu di kwa nke nēme ka ndu-ya di ogologo n'ihe ọjọ ya.

16. Abubigala onye ezi omume ókè; eme-kwa-la onwe-gi onye mabigara ihe ókè: n'ìhi gini ka i gēmebi onwe-gi?

17. Emebibigala iwu ókè, abu-kwa-la onye-nzuzu: n'ìhi gini ka i gānwuchu anwuchu?

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Eklisiastis 7