Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Eklisiastis 7:1-14 Bible Nso (IGBOB)

1. Ezi aha di nma kari ezi manu-otite nēsì ísì utọ; ọzọ, ubọchi ọnwu madu di nma kari ubọchi amuru ya.

2. Ọ di nma ije n'ulo oruru-újú, kari ije n'ulo ọṅuṅu-manya-vine: n'ihi na nke ahu bu nsọtu madu nile; onye di ndu gētiye kwa ya n'obi-ya.

3. Iru-újú di nma kari ichì-ọchì: n'ihi na esitere n'ijọ-njọ nke iru me ka obi di nma.

4. Obi ndi mara ihe di n'ulo oruru-újú; ma obi ndi-nzuzu di n'ulo ọṅù.

5. Ọ di nma inu ibasi-nba-ike nke onye mara ihe, karia mb͕e madu nānu abù ndi-nzuzu.

6. N'ihi na dika olu ogwu mb͕e ọ nēre ọku n'okpuru ite, otú a ka ichì-ọchì nke onye-nzuzu di: nka bu kwa ihe-efu.

7. N'ezie nmeb͕u nēme ka onye mara ihe ghọ onye-nzuzu; ọzọ, onyinye nēme ka obi amam-ihe la n'iyì.

8. Ikpe-azu ihe di nma kari nmalite-ya: ọ di nma, bú onye mọ-ya nwere ogologo-ntachi-obi, kari onye mọ-ya di elu.

9. Ekwela ka akpasue gi iwe ọsọsọ nime mọ-gi: n'ihi na nkpasu-iwe nwere ọnọdu-ya n'obi ndi-nzuzu.

10. Asila, Gini kpatara ubọchi mbu ji di nma kari ubọchi ndia? n'ihi na i siteghi n'amam-ihe ju ajuju bayere nka.

11. Amam-ihe di nma dika ihe-nketa: e, ọ dikariri ndi nāhu anyanwu anya nma.

12. N'ihi na amam-ihe bu ǹdò, ego bu kwa ǹdò: ma ọkaka nke ihe-ọmuma bu, na amam-ihe nēme ka onye-nwe-ya di ndu.

13. Le ọlu Chineke: n'ihi na ònye puru ime ka ọ dizie, bú ihe O meworo ka ọ b͕agọ?

14. N'ubọchi ọdi-nma-gi nọ n'ọdi-nma, ma n'ubọchi ọdi-njọ le anya: ọbuná otù na nso ibe-ya ka Chineke meworo ha, ka madu we ghara ichọputa ihe ọ bula nke gādi mb͕e ọ gasiri.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Eklisiastis 7