isiakwụkwọ

  1. 1
  2. 2
  3. 3
  4. 4
  5. 5
  6. 6
  7. 7
  8. 8
  9. 9
  10. 10
  11. 11
  12. 12

Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Eklisiastis 11 Bible Nso (IGBOB)

1. Zipu nri-gi n'elu miri: n'ihi na mb͕e ọtutu ubọchi gasiri i gāhu ya.

2. Nye asa òkè, e, nye kwa asatọ; n'ihi na i maghi ihe ọjọ di aṅa gādi n'uwa.

3. Ọ buru na igwe-oji ejuputa na miri-ozuzo, n'ala ka ha nāwusa onwe-ha: ọ buru kwa na osisi ada na Ndida, ma-ọbu n'Ugwu, n'ebe osisi ahu nāda, n'ebe ahu ka ọ gādigide.

4. Onye nāriba ifufe ama agaghi-agha nkpuru; ọzọ, onye nēlekwasi igwe-oji anya agaghi-ewe ihe-ubi.

5. Dika i nēsighi ma ihe bu uzọ ifufe, ma-ọbu otú ọkpukpu nile si etó n'afọ nwanyi di ime; ọbuná otú a i dighi-ama ọlu Chineke Nke nēme ha nile.

6. Gha nkpuru-gi n'ututu, ewepu-kwa-la aka-gi n'anyasi: n'ihi na i dighi-ama nke gāgazi agazi, ma ọ bu nka ma-ọbu nke-ọzọ, ma-ọbu na ha abua gādi nma otù aka ahu.

7. Ọzọ, ìhè di utọ, ọ di-kwa-ra anya abua nma ihu anyanwu.

8. E, ọ buru na madu adi ndu ọtutu arọ, ya ṅuria nime ha nile; ma ya cheta ubọchi nile nke ọchichiri, n'ihi na ha gāba uba. Ihe nile nke nābia bu ihe-efu.

9. Ṅuria, nwa-okorọbia, na nwata i bu; ka obi-gi me kwa gi nma n'ubọchi nile nke okorọbia i bu, je kwa ije n'uzọ nile nke obi-gi, na n'ọhuhu-uzọ nke anya-gi abua: ma mara na n'ihi ihe ndia nile Chineke gēme ka i ba n'ikpé.

10. Ma wezuga nkpasu-iwe n'obi-gi, me kwa ka ihe ọjọ si n'anu-aru-gi gabiga: n'ihi na okorọbia na mb͕e-dìnkpà bu ihe-efu.