Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Eklisiastis 10:5-10 Bible Nso (IGBOB)

5. Ihe ọjọ di nke m'huworo n'okpuru anyanwu, ọ di ka ihe emere n'amaghi-ama nke nēsi n'aka onye nāchi achi aputa:

6. etiyere nzuzu n'ebe di iche iche di elu ri nne, ma ndi-ọgaranya nānọdu n'ebe di ala.

7. Ahuwom ndi-orù ka ha nānọkwasi n'inyinya, ahuwokwam ndi-isi ka ha nējeghari dika ndi-orù n'elu uwa.

8. Onye nēgwu olulu, nime ya ka ọ gādabà; ọzọ, onye nētipú mb͕idi, agwọ gāta ya aru.

9. Onye nēbupu nkume, o gēb͕u ya nb͕u site na ha; onye nāwa osisi nọ n'ize-ndu site na ya.

10. Ọ buru na ígwè anyua nkọ, ma onye ahu amughi iru-ya amu, ọ gētiye kwa ike kari: ma amam-ihe nāba urù ime ka ihe nāgazi agazi.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Eklisiastis 10