Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Eklisiastis 10:10-20 Bible Nso (IGBOB)

10. Ọ buru na ígwè anyua nkọ, ma onye ahu amughi iru-ya amu, ọ gētiye kwa ike kari: ma amam-ihe nāba urù ime ka ihe nāgazi agazi.

11. Ọ buru na agwọ ata aru tutu arà ya urà, ọ dighi kwa urù ọ gābara onye-nwe ire-utọ.

12. Okwu nile nke ọnu onye mara ihe di amara; ma eb͕ub͕ere-ọnu nke onye-nzuzu gēloda ya onwe-ya.

13. Nmalite okwu nile nke ọnu-ya bu nzuzu: nkwubì okwu-ọnu-ya bu kwa iwi-ara ọjọ.

14. Onye-nzuzu nēme kwa ka okwu ba uba: madu adighi-ama ihe ọ bula nke gādi adi; ọzọ, ihe gādi mb͕e ọ gasiri, ònye gēgosi ya?

15. Ndọb͕u nke ndi-nzuzu nādọb͕u onwe-ha n'ọlu nāgwu onye ọ bula nime ha ike, n'ihi na ọ maghi ijeru obodo.

16. Ahuhu gādiri gi, ala, mb͕e eze-gi bu nwata, mb͕e ndi-isi-gi nēri kwa ihe n'ututu!

17. Ihe nāgara gi nke-ọma, ala, mb͕e eze-gi bu nwa ndi amara aha-ha, mb͕e ndi-isi-gi nēri kwa ihe na mb͕e oriri, n'ihi idi-ike, ọ bughi kwa n'ihi iṅubiga-manya-ókè!

18. Site n'okè ume-ngwu ka elu ulo nēze eze; site kwa n'ifanye aka n'ukwu ka ulo nēhi mmiri.

19. N'ihi ichì-ọchì ka anēsi nri, manya-vine nēme ka ndu ṅuria: ego nāza kwa ihe nile.

20. Ọbuná n'uche-gi akọchala eze; akọcha-kwa-la ọgaranya n'ime-ulo-ndina-gi: n'ihi na anu-ufe nke elu-igwe gēme ka olu-gi rue ya nti, ihe nwere nkù gēgosi kwa okwu ahu.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Eklisiastis 10