27. Cheta ndi-orù-Gi, bú Abraham, na Aisak, na Jekob; echela iru n'ikwesi-olu-ike nke ndi nka, ma-ọbu na nmebi-iwu-ha, ma-ọbu na nmehie-ha:
28. ka ala ahu nke I mere ka ayi si n'ebe ahu puta we ghara isi, N'ihi na Jehova apughi ime ka ha ba n'ala ahu nke Ọ gwara ha okwu bayere ya, na n'ihi na Ọ kpọrọ ha asì, O mewo ka ha puta ka O we me ka ha nwua n'ọzara.
29. Ma ha onwe-ha bu ndi-Gi na ihe-nketa-Gi, ndi I were ike uku Gi na ogwe-aka-Gi eseteri eseti me ka ha puta.