Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Deuteronomi 9:22-29 Bible Nso (IGBOB)

22. Ọ bu kwa nime Tabera, na nime Masa, na nime Kibrot-hataava, ka unu bu ndi nākpasu Jehova iwe.

23. Mb͕e Jehova siri na Kedesh-banea ziga unu, si, Rigonu, nweta ala ahu nke M'nyeworo unu; unu we nupu isi n'okwu-ọnu Jehova, bú Chineke-unu, unu ekweghi kwa Ya, unu egeghi kwa nti n'olu-Ya.

24. Ndi nānupu isi ka unu bu n'ebe Jehova nọ site n'ubọchi m'mara unu.

25. M'we turu onwem n'ala n'iru Jehova ọgu ubọchi abua ahu, ehihie na abali, nke m'tururu onwem n'ala; n'ihi na Jehova siri na Ọ gēkpochapu unu.

26. M'we kpere Jehova, si, Onye-nwe-ayi Jehova, ebibila ndi-Gi na ihe-nketa-Gi, nke I b͕aputaworo n'idi-uku-Gi, nke I wereworo aka di ike me ka o si n'Ijipt puta.

27. Cheta ndi-orù-Gi, bú Abraham, na Aisak, na Jekob; echela iru n'ikwesi-olu-ike nke ndi nka, ma-ọbu na nmebi-iwu-ha, ma-ọbu na nmehie-ha:

28. ka ala ahu nke I mere ka ayi si n'ebe ahu puta we ghara isi, N'ihi na Jehova apughi ime ka ha ba n'ala ahu nke Ọ gwara ha okwu bayere ya, na n'ihi na Ọ kpọrọ ha asì, O mewo ka ha puta ka O we me ka ha nwua n'ọzara.

29. Ma ha onwe-ha bu ndi-Gi na ihe-nketa-Gi, ndi I were ike uku Gi na ogwe-aka-Gi eseteri eseti me ka ha puta.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Deuteronomi 9