Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Deuteronomi 9:17-27 Bible Nso (IGBOB)

17. M'we jide mdadamba nkume abua ahu, tupu ha n'akam abua, tupia ha n'anya-unu.

18. M'we turu onwem n'ala n'iru Jehova, dika na mbu, ọgu ubọchi abua ehihie na abali; ọ dighi nri m'riri, ọ dighi kwa miri m'ṅuru; n'ihi nmehie-unu nile nke unu mehiere, n'ime ihe ọjọ ahu n'anya Jehova, ikpasu Ya iwe.

19. N'ihi na ujọ iwe na ọnuma, nke Jehova ji we iwe megide unu ikpochapu unu, turum. Ma Jehova ge-kwa-ram nti na mb͕e ahu.

20. Jehova wesa-kwa-ra Eron iwe nke-uku ikpochapu ya: m'we kpe kwa ekpere bayere Eron na mb͕e ahu.

21. Nmehie-unu ahu, bú nwa-ehi ahu nke unu mere, m'we were ya sure ya n'ọku, zọpia ya, gwe ya nke-ọma, rue mb͕e ọ mere imurimu dika uzuzu: m'we wuye uzuzu-ya nime miri-iyi nke si n'ugwu ahu nērùdata.

22. Ọ bu kwa nime Tabera, na nime Masa, na nime Kibrot-hataava, ka unu bu ndi nākpasu Jehova iwe.

23. Mb͕e Jehova siri na Kedesh-banea ziga unu, si, Rigonu, nweta ala ahu nke M'nyeworo unu; unu we nupu isi n'okwu-ọnu Jehova, bú Chineke-unu, unu ekweghi kwa Ya, unu egeghi kwa nti n'olu-Ya.

24. Ndi nānupu isi ka unu bu n'ebe Jehova nọ site n'ubọchi m'mara unu.

25. M'we turu onwem n'ala n'iru Jehova ọgu ubọchi abua ahu, ehihie na abali, nke m'tururu onwem n'ala; n'ihi na Jehova siri na Ọ gēkpochapu unu.

26. M'we kpere Jehova, si, Onye-nwe-ayi Jehova, ebibila ndi-Gi na ihe-nketa-Gi, nke I b͕aputaworo n'idi-uku-Gi, nke I wereworo aka di ike me ka o si n'Ijipt puta.

27. Cheta ndi-orù-Gi, bú Abraham, na Aisak, na Jekob; echela iru n'ikwesi-olu-ike nke ndi nka, ma-ọbu na nmebi-iwu-ha, ma-ọbu na nmehie-ha:

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Deuteronomi 9