Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Deuteronomi 9:12-22 Bible Nso (IGBOB)

12. Jehova we sim, Bilie, si n'ebe a rida ngwa ngwa; n'ihi na ndi-gi, nke i meworo ka ha si n'Ijipt puta, ebibiwo onwe-ha; ha esiwo n'uzọ nke M'nyere ha n'iwu wezuga onwe-ha ngwa ngwa; ha emeworo onwe-ha nwa-ehi awuru awu.

13. Jehova we gwam okwu, si Ahuwom ndi nka, ma, le, ndi kwesiri olu ike ka ọ bu:

14. ram aka, ka M'we kpochapu ha, hichapu kwa aha-ha n'okpuru elu-igwe: M'gēme kwa gi ka i buru mba di ike ba kwa uba kari ha.

15. M'we chigharia, si n'ugwu ahu rida, ugwu ahu nēre kwa ọku: mbadamba nkume abua nke ọb͕ub͕a-ndu ahu di kwa n'elu akam abua.

16. M'we hu, ma, le, unu emehiewo megide Jehova, bú Chineke-unu; unu emeworo onwe-unu nwa-ehi awuru awu: unu esiwo n'uzọ nke Jehova nyere unu n'iwu wezuga onwe-unu ngwa ngwa.

17. M'we jide mdadamba nkume abua ahu, tupu ha n'akam abua, tupia ha n'anya-unu.

18. M'we turu onwem n'ala n'iru Jehova, dika na mbu, ọgu ubọchi abua ehihie na abali; ọ dighi nri m'riri, ọ dighi kwa miri m'ṅuru; n'ihi nmehie-unu nile nke unu mehiere, n'ime ihe ọjọ ahu n'anya Jehova, ikpasu Ya iwe.

19. N'ihi na ujọ iwe na ọnuma, nke Jehova ji we iwe megide unu ikpochapu unu, turum. Ma Jehova ge-kwa-ram nti na mb͕e ahu.

20. Jehova wesa-kwa-ra Eron iwe nke-uku ikpochapu ya: m'we kpe kwa ekpere bayere Eron na mb͕e ahu.

21. Nmehie-unu ahu, bú nwa-ehi ahu nke unu mere, m'we were ya sure ya n'ọku, zọpia ya, gwe ya nke-ọma, rue mb͕e ọ mere imurimu dika uzuzu: m'we wuye uzuzu-ya nime miri-iyi nke si n'ugwu ahu nērùdata.

22. Ọ bu kwa nime Tabera, na nime Masa, na nime Kibrot-hataava, ka unu bu ndi nākpasu Jehova iwe.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Deuteronomi 9