Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Deuteronomi 9:1-7 Bible Nso (IGBOB)

1. Nuru, Israel: gi onwe-gi nāgabiga Jọdan ta, ibà ka i we nweta mba di iche iche di uku di kwa ike kari gi, obodo di iche iche di uku nke ewusi-kwa-ra ike rue elu-igwe;

2. otù ndi di uku di kwa ogologo, bú umu ndi Anak, ndi gi onwe-gi mara, ndi gi onwe-gi nuwo-kwa-ra okwu bayere ha, si, Ònye gēguzo onwe-ya n'iru umu Anak?

3. Ma i mawo ta, na Jehova, bú Chineke-gi, Ya onwe-ya bu onye nāgabiga n'iru gi dika ọku nēripia eripia; Ya onwe-ya gēkpochapu ha, Ya onwe-ya gēme kwa ka ha ruru ala n'iru gi: i we napu ha ala-ha, me kwa ka ha la n'iyì ngwa ngwa, dika Jehova gwaworo gi okwu.

4. Ekwula n'obi-gi, mb͕e Jehova, bú Chineke-gi, kwapusiri ha n'iru gi, si, N'ihi ezi omumem ka Jehova mere ka m'bata inweta ala nka: ma ọ bu n'ihi nmebi-iwu nke mba ndia ka Jehova nānapu ha ala-ha n'iru gi.

5. Ọ bughi n'ihi ezi omume-gi, ma-ọbu n'ihi nziri-ezi nke obi-gi, ka gi onwe-gi nābà inweta ala-ha: kama ọ bu n'ihi nmebi-iwu nke mba ndia ka Jehova, bú Chineke-gi, nānapu ha ala-ha n'iru gi, ka Ọ we me kwa ka okwu ahu guzosie ike nke Jehova ṅuru nna-gi-hà iyi, bú Abraham, na Aisak, na Jekob.

6. I mawo kwa na ọ bughi n'ihi ezi omume-gi ka Jehova, bú Chineke-gi, nēnye gi ezi ala nka ka i nweta ya; n'ihi na ndi kwesiri olu ike ka i bu.

7. Cheta, echezọla, ihe nke i ji kpasu Jehova, bú Chineke-gi, iwe n'ọzara: site n'ubọchi mb͕e i si n'ala Ijipt puta, rue mb͕e unu biaruru ebe a, ndi nānupu isi ka unu buworo n'ebe Jehova nọ.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Deuteronomi 9