Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Deuteronomi 7:13-26 Bible Nso (IGBOB)

13. Ọ gāhu kwa gi n'anya, gọzie gi, me ka i ba uba: Ọ gāgọzi kwa nkpuru nke afọ-gi, na nkpuru nke ala-gi, bú ọka-gi, na manya-vine ọhu gi, na manu-gi, na umu ehi-gi muru, na umu ìgwè ewu na aturu-gi, n'elu ala ahu nke Ọ ṅuru nna-gi-hà iyi inye gi.

14. Ndi agọziri agọzi ka i gābu kari ndi nile ọzọ: nwoke nēnweghi ike imu nwa na nwayi-àgà agaghi-adi n'etiti gi, ma-ọbu n'etiti anu-ulo-gi.

15. Jehova gēwezuga kwa n'aru-gi ọria nile; nriaria ọjọ nile nke Ijipt nke i maworo, Ọ gaghi-atukwasi kwa ha n'aru-gi, ma Ọ gētiye ha n'aru ndi nākpọ gi asì.

16. I gēripia kwa ndi ahu nile nke Jehova, bú Chineke-gi, nēnye gi; anya-gi agaghi-emere ha ebere: efè-kwa-la chi-ha di iche iche òfùfè; n'ihi na ọnyà ka ọ gāburu gi.

17. Mb͕e i gāsi n'obi-gi, Mba ndia bara uba karim; #m'gēsi aṅa pu inapu ha ala-ha?

18. atula egwu ha: i gēcheta nke-ọma ihe nke Jehova, bú Chineke-gi, mere Fero, me kwa Ijipt nile;

19. ọnwunwa uku nile nke anya-gi huru, na ihe-iriba-ama nile, na ihe-ebube nile, na aka ahu di ike, na ogwe-aka ahu esetiri eseti, nke Jehova, bú Chineke-gi, ji me ka i puta: otú a ka Jehova, bú Chineke-gi, gēme ndi ahu nile ndi gi onwe-gi nātu egwu ha.

20. Ọzọ kwa, ọ bu ebu ka Jehova, bú Chineke-gi, gēsì n'etiti ha, rue mb͕e ndi fọduru, ndi nēzopu kwa onwe-ha n'iru gi, gāla n'iyì.

21. Amala jijiji n'iru ha: n'ihi na Jehova, bú Chineke-gi, nọ n'etiti gi, Ọ bu Chineke uku, di kwa egwu.

22. Ma Jehova, bú Chineke-gi, gēwepu mba ahu n'iru-gi nke-ntà nke-ntà: i pughi ime ka ha gwusia ngwa ngwa, ka anu-ọhia ghara iba uba megide gi.

23. Ma Jehova, bú Chineke-gi, gāra ha nye n'iru gi, me kwa ka ha b͕a aghara uku, rue mb͕e agēkpochapu ha.

24. Ọ gēnye kwa ndi-eze-ha n'aka-gi, i gēme kwa ka aha-ha lapu n'iyì n'okpuru elu-igwe: ọ dighi nwoke ọ bula gēguzo onwe-ya n'iru gi, rue mb͕e i gēkpochapu ha.

25. Unu gēsure arusi nile apiri api nke chi nile ha n'ọku: enwela anya-uku n'ọla-ọcha na ọla-edo nke di n'aru ha, ewe-kwa-la n'onwe-gi, ka aghara ima gi n'ọnyà nime ya: n'ihi na ihe-árú nke Jehova, bú Chineke-gi, ka ọ bu:

26. eme-kwa-la ka ihe-árú ba n'ulo-gi, i we ghọ ihe ewezugara ka ebibie ya dika ya: i gājusi ya aju, kpọ kwa ya ihe rusiri árú; n'ihi na ihe ewezugara ka ebibie ya ka ọ bu.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Deuteronomi 7