Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Deuteronomi 7:11-20 Bible Nso (IGBOB)

11. I gēdebe kwa ihe ahu enyere n'iwu, na ukpuru nile, na ikpé nile, nke mu onwem nēnye gi n'iwu ta, ka i we me ha.

12. Ọ gēru kwa, n'ihi na unu nānu ikpé ndia, debe kwa ha, me kwa ha, na Jehova, bú Chineke-gi, gēdebe-kwa-ra gi ọb͕ub͕a-ndu ahu na ebere ahu nke Ọ ṅuru nna-gi-hà iyi imere ha:

13. Ọ gāhu kwa gi n'anya, gọzie gi, me ka i ba uba: Ọ gāgọzi kwa nkpuru nke afọ-gi, na nkpuru nke ala-gi, bú ọka-gi, na manya-vine ọhu gi, na manu-gi, na umu ehi-gi muru, na umu ìgwè ewu na aturu-gi, n'elu ala ahu nke Ọ ṅuru nna-gi-hà iyi inye gi.

14. Ndi agọziri agọzi ka i gābu kari ndi nile ọzọ: nwoke nēnweghi ike imu nwa na nwayi-àgà agaghi-adi n'etiti gi, ma-ọbu n'etiti anu-ulo-gi.

15. Jehova gēwezuga kwa n'aru-gi ọria nile; nriaria ọjọ nile nke Ijipt nke i maworo, Ọ gaghi-atukwasi kwa ha n'aru-gi, ma Ọ gētiye ha n'aru ndi nākpọ gi asì.

16. I gēripia kwa ndi ahu nile nke Jehova, bú Chineke-gi, nēnye gi; anya-gi agaghi-emere ha ebere: efè-kwa-la chi-ha di iche iche òfùfè; n'ihi na ọnyà ka ọ gāburu gi.

17. Mb͕e i gāsi n'obi-gi, Mba ndia bara uba karim; #m'gēsi aṅa pu inapu ha ala-ha?

18. atula egwu ha: i gēcheta nke-ọma ihe nke Jehova, bú Chineke-gi, mere Fero, me kwa Ijipt nile;

19. ọnwunwa uku nile nke anya-gi huru, na ihe-iriba-ama nile, na ihe-ebube nile, na aka ahu di ike, na ogwe-aka ahu esetiri eseti, nke Jehova, bú Chineke-gi, ji me ka i puta: otú a ka Jehova, bú Chineke-gi, gēme ndi ahu nile ndi gi onwe-gi nātu egwu ha.

20. Ọzọ kwa, ọ bu ebu ka Jehova, bú Chineke-gi, gēsì n'etiti ha, rue mb͕e ndi fọduru, ndi nēzopu kwa onwe-ha n'iru gi, gāla n'iyì.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Deuteronomi 7