Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Deuteronomi 7:1-8 Bible Nso (IGBOB)

1. Mb͕e Jehova, bú Chineke-gi, gēme ka i ba n'ala ahu ebe gi onwe-gi nābà inweta ya, mb͕e Ọ gēwepu kwa ọtutu mba n'iru gi, bu ndi Het, na ndi-Giagashait, na ndi-Amorait, na ndi Kenean, na ndi-Perizait, na ndi-Haivait, na ndi Jebus, mba asa bara uba di kwa ike kari gi;

2. mb͕e Jehova, bú Chineke-gi, gāra kwa ha nye n'iru gi, i we tib͕ue ha; i gēwezugasi kwa ha ka ebibie ha; gi na ha ab͕ala ndu, eme-kwa-la ha amara:

3. gi na ha alurita-kwa-la nwunye; enyela nwa-ya nwoke nwa-gi nwayi, ekuru-kwa-la nwa-ya nwayi nye nwa-gi nwoke.

4. N'ihi na ọ gēwezuga nwa-gi nwoke n'isom n'azu, ka ha we fè chi ọzọ: iwe Jehova gādi kwa ọku megide unu, Ọ gēkpochapu kwa gi ngwa ngwa.

5. Kama otú a ka unu gēme ha; unu gākwatu ebe-ichu-àjà nile ha, tupia kwa ogidi nile ha, b͕utu kwa Asherim-ha, sure kwa arusi nile ha apiri api n'ọku.

6. N'ihi na ndi nsọ ka i buru Jehova, bú Chineke-gi: ọ bu gi ka Jehova, bú Chineke-gi, rọputaworo iburu Ya ihe nke aka Ya, kari ndi nile ndi nọ n'elu ala.

7. Ọ bughi na unu bara uba kari ndi nile ka Jehova huru unu n'anya si-ike, we rọputa unu; n'ihi na unu onwe-unu di ole-na-ole kari ndi nile ọzọ:

8. kama ọ bu n'ihi na Jehova huru unu n'anya, na n'ihi na O debere iyi Ọ ṅuru nna-unu-hà, ka Jehova were aka di ike me ka unu puta, O we b͕aputa unu n'ulo ndi-orù, n'aka Fero, bú eze Ijipt.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Deuteronomi 7