Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Deuteronomi 6:7-21 Bible Nso (IGBOB)

7. i gējisi kwa ike izí ha-umu-gi, i gēkwu kwa okwu bayere ha mb͕e i nānọdu n'ulo-gi, na mb͕e i nēje ije n'uzọ, na mb͕e i nēdina ala, na mb͕e i nēbili ọtọ.

8. I gēke kwa ha n'elu aka-gi ka ha buru ihe-iriba-ama, ha gābu kwa nkpọ-n'iru n'etiti anya-gi abua.

9. I gēdekwasi kwa ha n'awara-uzọ abua nke ulo-gi, na n'ọnu-uzọ-ama-gi nile.

10. O gēru kwa, mb͕e Jehova, bú Chineke-gi, gēme ka i ba n'ala ahu nke Ọ ṅuru nna-gi-hà, bú Abraham, na Aisak, na Jekob, iyi, inye gi; obodo uku di iche iche ma-kwa-ra nma, nke i nēwughi,

11. na ulo juputara n'ezi ihe nile, nke i nēmejughi, na olùlù-miri egwuwara egwuwa, nke i nēgwuwaghi, na ubi-vine na osisi olive, nke i nākughi, mb͕e i gēri kwa, afọ eju kwa gi;

12. gi lezie onwe-gi anya, ka i ghara ichezọ Jehova, Onye mere ka i si n'ala Ijipt, si kwa n'ulo ndi-orù, puta.

13. Jehova, bú Chineke-gi, ka i gātu egwu; ọ bu kwa Ya ka i gēfè òfùfè, ọ bu kwa aha-Ya ka i gēwere ṅu iyi.

14. Unu ejesola chi ọzọ, ndi sitere na chi nke ndi ahu ndi nọ unu buruburu;

15. n'ihi na Chineke ekworo ka Jehova, bú Chineke-gi, bu n'etiti gi; ka iwe Jehova, bú Chineke-gi, we ghara idi ọku megide gi, O we kpochapu gi n'elu ala.

16. Unu anwala Jehova, bú Chineke-unu, dika unu nwara Ya nime Masa.

17. Unu gējisi ike idebe ihe ahu nile nke Jehova, bú Chineke-unu, nyere n'iwu, unu gēdebe kwa ihe-àmà-Ya nile, na ukpuru-Ya nile, nke O nyeworo gi n'iwu.

18. I gēme kwa ihe ziri ezi na nke di nma n'anya Jehova: ka o we diri gi nma, ka i we ba kwa, nweta ezi ala ahu, nke Jehova ṅuru nna-gi-hà iyi inye ha,

19. ikwapu ndi-iro-gi nile n'iru gi, dika Jehova kwuworo.

20. Mb͕e nwa-gi gāju gi n'ọdi-n'iru, si, Gini bu isi ihe-àmà ndia, na ukpuru ndia, na ikpé ndia, nke Jehova, bú Chineke-ayi, nyeworo unu n'iwu?

21. i gāsi kwa nwa-gi, Ayi buru Fero ndi-orù n'Ijipt; Jehova we were aka di ike me ka ayi si n'Ijipt puta:

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Deuteronomi 6