Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Deuteronomi 6:12-25 Bible Nso (IGBOB)

12. gi lezie onwe-gi anya, ka i ghara ichezọ Jehova, Onye mere ka i si n'ala Ijipt, si kwa n'ulo ndi-orù, puta.

13. Jehova, bú Chineke-gi, ka i gātu egwu; ọ bu kwa Ya ka i gēfè òfùfè, ọ bu kwa aha-Ya ka i gēwere ṅu iyi.

14. Unu ejesola chi ọzọ, ndi sitere na chi nke ndi ahu ndi nọ unu buruburu;

15. n'ihi na Chineke ekworo ka Jehova, bú Chineke-gi, bu n'etiti gi; ka iwe Jehova, bú Chineke-gi, we ghara idi ọku megide gi, O we kpochapu gi n'elu ala.

16. Unu anwala Jehova, bú Chineke-unu, dika unu nwara Ya nime Masa.

17. Unu gējisi ike idebe ihe ahu nile nke Jehova, bú Chineke-unu, nyere n'iwu, unu gēdebe kwa ihe-àmà-Ya nile, na ukpuru-Ya nile, nke O nyeworo gi n'iwu.

18. I gēme kwa ihe ziri ezi na nke di nma n'anya Jehova: ka o we diri gi nma, ka i we ba kwa, nweta ezi ala ahu, nke Jehova ṅuru nna-gi-hà iyi inye ha,

19. ikwapu ndi-iro-gi nile n'iru gi, dika Jehova kwuworo.

20. Mb͕e nwa-gi gāju gi n'ọdi-n'iru, si, Gini bu isi ihe-àmà ndia, na ukpuru ndia, na ikpé ndia, nke Jehova, bú Chineke-ayi, nyeworo unu n'iwu?

21. i gāsi kwa nwa-gi, Ayi buru Fero ndi-orù n'Ijipt; Jehova we were aka di ike me ka ayi si n'Ijipt puta:

22. Jehova we tiyekwasi ihe-iriba-ama di iche iche na ihe-ebube di iche iche, di uku jọ kwa njọ, n'aru Ijipt, na n'aru Fero, na n'aru ulo-ya nile, n'anya-ayi:

23. ọ bu kwa ayi ka O mere ka ayi si n'ebe ahu puta, ka O we me ka ayi ba nime, ka O we nye ayi ala ahu nke Ọ ṅuru nna-ayi-hà iyi inye ha.

24. Jehova we nye ayi iwu ime ukpuru ndia nile, itu egwu Jehova, bú Chineke-ayi, ka o we diri ayi nma ubọchi-ayi nile, ka O we debe ayi ndu, otú ọ di ta.

25. Ezi omume ka ọ gābu-kwa-ra ayi, mb͕e ayi gēlezi anya ime ihe a nile enyere n'iwu n'iru Jehova, bú Chineke-ayi, dika O nyere ayi iwu.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Deuteronomi 6