Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Deuteronomi 6:1-5 Bible Nso (IGBOB)

1. Ma nka bu ihe ahu enyere n'iwu, na ukpuru nile, na ikpé nile, nke Jehova, bú Chineke-unu, nyere iwu ka ezí unu, ka unu we me ha n'ala ahu ebe unu onwe-unu nāgabiga inweta ya;

2. ka i we tua egwu Jehova, bú Chineke-gi, idebe ukpuru-Ya nile na ihe nile O nyere n'iwu, nke Mu onwem nēnye gi n'iwu, gi onwe-gi, na nwa-gi, na nwa nwa-gi, ubọchi nile nke ndu-gi; ka ubọchi-gi we di kwa anya.

3. I gānu kwa, Israel, lezi kwa anya ime ya; ka o we diri gi nma, ka unu we ba kwa uba nke-uku, dika Jehova, bú Chineke nna-gi-hà, gwaworo gi okwu, n'ala nke miri-ara-ehi na manu-aṅu nērù nime ya.

4. Nuru, Israel; Jehova, bú Chineke-ayi, Jehova bu otù:

5. i gēwere kwa obi-gi nile, were kwa nkpuru-obi-gi nile, were kwa ike-gi nile, hu Jehova, bú Chineke-gi, n'anya.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Deuteronomi 6