Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Deuteronomi 5:3-9 Bible Nso (IGBOB)

3. Ọ bughi nna-ayi-hà ka Jehova b͕ara ọb͕ub͕a-ndu a nye, kama ọ bu ayi, ọbuná ayi onwe-ayi, ndi nọ n'ebe a na ndu ta, ayi nile.

4. Iru na iru ka Jehova kpayere unu uka n'ugwu ahu site n'etiti ọku ahu,

5. (mu onwem nēguzo n'etiti Jehova na unu na mb͕e ahu, igosi unu okwu Jehova: n'ihi na unu turu egwu n'ihi ọku ahu, unu arigoghi kwa n'ugwu ahu;) si,

6. Mu onwem bu Jehova, bú Chineke-gi, Onye mere ka i si n'ala Ijipt, n'ulo ndi-orù, puta.

7. Gi enwela chi ọzọ tiyerem.

8. Gi emerela onwe-gi arusi apiri api, bú oyiyi nke udi ọ bula nke di n'elu-igwe n'elu, ma-ọbu nke di n'uwa n'okpuru ya, ma-ọbu nke di na miri n'okpuru uwa:

9. gi akpọla isi ala nye ha, efè-kwa-la ha òfùfè: n'ihi na Mu onwem, bú Jehova Chineke-gi, bu Chineke ekworo, nēwere ajọ omume nke ndi bu nna leta umu-ha, leta kwa umu-umu nke-atọ, leta kwa nke-anọ, nke ndi nākpọm asì;

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Deuteronomi 5