Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Deuteronomi 4:32-47 Bible Nso (IGBOB)

32. N'ihi na biko, jua ajuju bayere ubọchi nile gara aga, nke buru gi uzọ, site n'ubọchi mb͕e Chineke kere madu n'elu uwa, site kwa n'otù nsọtu elu-igwe we rue nsọtu elu-igwe ọzọ, ma ihe dika ihe uku a adiwo, ma-ọbu na anuwo ihe di ka ya.

33. Ọ̀di ndi ọ bula nuru olu Chineke ka o nēsi n'etiti ọku kwue okwu, dika gi onwe-gi nuworo, we di ndu?

34. Ma-ọbu Chineke, Ọ̀ nwawo ibà nime otù mba isi n'etiti ya were n'Onwe-ya mba ọzọ, n'ọnwunwa di iche iche, na n'ihe-iriba-ama di iche iche, na n'ihe-ebube di iche iche, na n'agha, na n'aka di ike, na n'ogwe-aka esetiri eseti, na n'oké egwu di iche iche, dika ihe nile si di nke Jehova, bú Chineke-unu, mere unu n'Ijipt n'anya-unu?

35. Emewo ka gi onwe-gi hu ya, ka i we mara na Jehova, Ya onwe-ya bu Chineke; ọ dighi onye ọzọ ma-ọbughi Ya;

36. N'elu-igwe ka O si me ka i nu olu-Ya, ka O we dọ gi aka na nti: n'elu uwa ka O me-kwa-ra gi ka i hu ọku uku Ya; i we nu okwu-Ya nile site n'etiti ọku ahu.

37. Ma n'ihi na Ọ huru nna-gi-hà n'anya, O we rọputa nkpuru-ha nọchiri ha, O we were ike uku Ya me ka i si n'Ijipt puta n'iru Ya;

38. ka O we napu mba uku di kwa ike kari gi ala-ha n'iru gi, ime ka i ba, ka O we nye gi ala-ha ibu ihe-nketa, otú ọ di ta.

39. I mawo kwa ta, cheta-kwa-ra obi-gi, na Jehova, Ya onwe-ya bu Chineke n'elu-igwe di n'elu na n'elu uwa di n'okpuru: ọ dighi onye ọzọ.

40. I gēdebe kwa ukpuru-Ya nile, na ihe nile O nyere n'iwu, nke Mu onwem nēnye gi n'iwu ta, ka o we diri gi nma, di-kwa-ra umu-gi gānọchi gi, ka i we me kwa ka ubọchi-gi di anya n'elu ala ahu, nke Jehova, bú Chineke-gi, nēnye gi, ubọchi nile.

41. Mb͕e ahu Moses kpaputara obodo atọ n'ofè Jọdan n'uzọ ọwuwa-anyanwu;

42. ka ob͕u-madu we b͕alaga n'ebe ahu, bú onye nēb͕u ab͕ata-obi-ya nāmaghi ama, ma ya onwe-ya akpọghi ya asì na mb͕e gara aga; ka ọ we b͕alaga n'otù nime obodo ahu, we di ndu:

43. bú Biza nime ọzara, n'ala ahu di lari, ka ọ diri ndi Reuben; na Remot nime Gilead, ka ọ diri ndi Gad; na Golan nime Beshan, ka ọ diri ndi Manase.

44. Nka bu kwa iwu ahu nke Moses doro n'iru umu Israel:

45. ndia bu ihe-àmà, na ukpuru, na ikpé, nke Moses gwara umu Israel, mb͕e ha si n'Ijipt puta;

46. n'ofè Jọdan, na ndagwurugwu ahu na ncherita-iru Bet-peoa, n'ala Saihon, bú eze ndi-Amorait, onye bi na Heshbon, onye Moses na umu Israel tib͕uru, mb͕e ha si n'Ijipt puta:

47. ha we nweta ala-ya, na ala Og, bú eze Beshan, bú eze abua ndi-Amorait, ndi di n'ofè Jọdan n'uzọ ọwuwa-anyanwu;

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Deuteronomi 4