Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Deuteronomi 4:2-13 Bible Nso (IGBOB)

2. Unu atukwasila ihe n'okwu ahu nke mu onwem nēnye unu n'iwu, unu agubì-kwa la ihe nime ya, idebe ihe nile Jehova, bú Chineke-unu, nyere n'iwu, bú nke mu onwem nēnye unu n'iwu.

3. Anya-unu nāhu ihe ahu nke Jehova mere n'okwu Beal-peoa: n'ihi na nwoke ọ bula nke jesoro Beal-peoa, Jehova, bú Chineke-gi, ekpochapuwo ya n'etiti gi.

4. Ma unu onwe-unu ndi nārapara n'aru Jehova, bú Chineke-unu, unu nādi ndu ta, unu nile.

5. Le, ezíwom unu ukpuru di iche iche na ikpé di iche íche, dika Jehova, bú Chinekem, nyerem iwu, ka unu we me otú a n'etiti ala ahu ebe unu onwe-unu nābà inweta ya.

6. Debe-kwa-nu ha, me kwa ha; n'ihi na nka bu amam-ihe-unu na nghọta-unu n'anya ndi nile, ndi gānu ukpuru ndia nile, we si, Otú ọ di, ndi mara ihe na ndi nwere nghọta ka mba uku a bu.

7. N'ihi na òle mba uku di, nke nwere chi di ya nso dika Jehova, bú Chineke-ayi, si di n'ihe nile ayi kpọkuworo Ya?

8. Òle mba uku di kwa, nke nwere ukpuru na ikpé ziri ezi dika iwu a nile, nke Mu onwem nētiye n'iru unu ta?

9. Nání lezie onwe-gi anya, debe kwa nkpuru-obi-gi nke-ọma, ka i ghara ichezọ ihe nile nke anya-gi abua huworo, ka ha ghara kwa isi n'obi-gi wezuga onwe-ha ubọchi nile nke ndu-gi; kama gi me ka umu-gi na umu umu-gi mara ha;

10. ubọchi nke i guzoro n'iru Jehova, bú Chineke-gi, nime Horeb, mb͕e Jehova sirim, Kpọkọtaram ndim, M'gēme kwa ka ha nu okwum nile, ka ha we muta itu egwum ubọchi nile nke ha onwe-ha nādi ndu n'elu ala, ka ha we zí kwa umu-ha.

11. Unu we biaru nso, guzo n'okpuru ugwu ahu; ugwu ahu nēre ọku rue obi elu-igwe, n'ọchichiri, na igwe-oji, na oké ọchichiri.

12. Jehova we si n'etiti ọku ahu gwa unu okwu: ọ bu olu okwu ka unu onwe-unu nānu, ma ọdighi onye unu nāhu anya; nání olu.

13. Ọ we gosi unu ọb͕ub͕a-ndu-Ya, nke Ọ nyere unu iwu ime, bú okwu iri ahu; Ọ we de ha n'elu mbadamba nkume abua.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Deuteronomi 4