Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Deuteronomi 4:1-5 Bible Nso (IGBOB)

1. Ma ub͕u a, Israel, ge nti ukpuru nile, ge kwa nti ikpé nile, nke mu onwem nēzí unu, ime ha; ka unu we di ndu, we ba, nweta kwa ala ahu nke Jehova, bú Chineke nke nna-unu-hà, nēnye unu.

2. Unu atukwasila ihe n'okwu ahu nke mu onwem nēnye unu n'iwu, unu agubì-kwa la ihe nime ya, idebe ihe nile Jehova, bú Chineke-unu, nyere n'iwu, bú nke mu onwem nēnye unu n'iwu.

3. Anya-unu nāhu ihe ahu nke Jehova mere n'okwu Beal-peoa: n'ihi na nwoke ọ bula nke jesoro Beal-peoa, Jehova, bú Chineke-gi, ekpochapuwo ya n'etiti gi.

4. Ma unu onwe-unu ndi nārapara n'aru Jehova, bú Chineke-unu, unu nādi ndu ta, unu nile.

5. Le, ezíwom unu ukpuru di iche iche na ikpé di iche íche, dika Jehova, bú Chinekem, nyerem iwu, ka unu we me otú a n'etiti ala ahu ebe unu onwe-unu nābà inweta ya.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Deuteronomi 4